Aịzaya 65:16
Isaiah 65:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onye ọbụla na-ekpe ekpere nʼala ahụ, ga-eme otu a nʼaha Chineke nke eziokwu, onye ọbụla na-aṅụkwa iyi nʼime ala ahụ ga-aṅụ iyi nʼaha Chineke nke eziokwu. Nʼihi na-echezolam nsogbu niile ndị gara aga, zokwa ha site nʼanya m.
Isaiah 65:16 in English
Isaiah 65:16 · Berean Standard Bible
Whoever invokes a blessing in the land will do so by the God of truth, and whoever takes an oath in the land will swear by the God of truth. For the former troubles will be forgotten and hidden from My sight.
Context
14Ndị ohu m ga-abụ abụ
nʼihi ọṅụ nke jupụtara nʼobi ha,
ma unu ga-akwa akwa,
nʼihi ihe mgbu nke obi unu,
tiekwa mkpu akwa nʼihi obi ntiwa nke mmụọ unu. 15Unu ga-ahapụ aha unu
nye ndị m họpụtara nye onwe m ka ọ bụrụ ihe ha ji abụ ọnụ;
nʼihi na Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ga-etigbu unu,
ma ọ ga-akpọ ndị ohu ya aha ọzọ. 16Onye ọbụla na-ekpe ekpere nʼala ahụ,
ga-eme otu a nʼaha Chineke nke eziokwu,
onye ọbụla na-aṅụkwa iyi nʼime ala ahụ
ga-aṅụ iyi nʼaha Chineke nke eziokwu.
Nʼihi na-echezolam nsogbu niile ndị gara aga,
zokwa ha site nʼanya m. 17“Nʼihi na lee, ana m eke
eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ.
Ọ dịghị onye ga-echetakwa ndị ochie ahụ ọzọ;
ọ gaghị abatakwa nʼechiche onye ọbụla. 18Ma ṅụrịanụ ọṅụ, tegharịakwa mgbe niile nʼobi ụtọ
nʼihi ihe nke mụ onwe m na-eke,
nʼihi na-aga eke Jerusalem ka ọ bụrụ ihe ọṅụ
ndị ya ga-abụkwa ihe obi ụtọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.