Aịzaya 62:5
Isaiah 62:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Dịka nwokorobịa si alụrụ nwaagbọghọ na-amaghị nwoke, otu a ka Onye na-ewu gị* ga-alụ gị, dịka onye lụrụ nwunye ọhụrụ sị aṅụrị ọṅụ nʼebe nwunye ọhụrụ ya nọ, otu a ka Chineke gị ga-aṅụrị ọṅụ nʼihi gị.
Isaiah 62:5 in English
Isaiah 62:5 · Berean Standard Bible
For as a young man marries a young woman, so your sons will marry you; and as a bridegroom rejoices over his bride, so your God will rejoice over you.
Context
3Ị ga-aghọ okpueze nke ịma mma nʼaka Onyenwe anyị,
ihe iyi nʼisi nke ndị ụlọeze nʼaka Chineke gị. 4A gakwaghị akpọ gị onye ahapụrụ ahapụ,
maọbụ kpọọ ala gị ala tọgbọrọ nʼefu.
Ma a ga-akpọ gị Hefziba,
kpọkwa ala gị Beula,
nʼihi na ihe gị ga-atọ Onyenwe anyị ụtọ,
a ga-alụkwa ala gị dịka nwunye. 5Dịka nwokorobịa si alụrụ nwaagbọghọ na-amaghị nwoke,
otu a ka Onye na-ewu gị* ga-alụ gị,
dịka onye lụrụ nwunye ọhụrụ sị aṅụrị ọṅụ nʼebe nwunye ọhụrụ ya nọ,
otu a ka Chineke gị ga-aṅụrị ọṅụ nʼihi gị. 6Enyela m ndị nche ọnọdụ ọrụ nʼelu mgbidi gị niile, Jerusalem.
Ha agaghị edebe ọnụ ha duu mgbe ọbụla, ma ehihie ma abalị.
Unu ndị na-akpọku Onyenwe anyị,
unu enyela onwe unu izuike. 7Unu enyekwala ya izuike tutu ruo mgbe ọ ga-eme ka Jerusalem guzosie ike,
meekwa ya otuto nke ụwa niile.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.