Aịzaya 62:3
Isaiah 62:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ị ga-aghọ okpueze nke ịma mma nʼaka Onyenwe anyị, ihe iyi nʼisi nke ndị ụlọeze nʼaka Chineke gị.
Isaiah 62:3 in English
Isaiah 62:3 · Berean Standard Bible
You will be a crown of glory in the hand of the LORD, a royal diadem in the palm of your God.
Context
1Nʼihi Zayọn agaghị m emechi ọnụ,
nʼihi Jerusalem agaghị m anọ jii,
ruo mgbe ezi omume ya ga-enwuwa dịka ihe ụtụtụ;
mgbe nzọpụta ya kwa ga-enwukwa dịka ọwaọkụ na-enwu enwu. 2Mba niile ga-ahụ ezi omume gị.
Ndị eze niile ga-ahụkwa ebube gị.
A ga-akpọkwa gị aha ọhụrụ ahụ
nke ọnụ Onyenwe anyị ga-agụ gị. 3Ị ga-aghọ okpueze nke ịma mma nʼaka Onyenwe anyị,
ihe iyi nʼisi nke ndị ụlọeze nʼaka Chineke gị. 4A gakwaghị akpọ gị onye ahapụrụ ahapụ,
maọbụ kpọọ ala gị ala tọgbọrọ nʼefu.
Ma a ga-akpọ gị Hefziba,
kpọkwa ala gị Beula,
nʼihi na ihe gị ga-atọ Onyenwe anyị ụtọ,
a ga-alụkwa ala gị dịka nwunye. 5Dịka nwokorobịa si alụrụ nwaagbọghọ na-amaghị nwoke,
otu a ka Onye na-ewu gị* ga-alụ gị,
dịka onye lụrụ nwunye ọhụrụ sị aṅụrị ọṅụ nʼebe nwunye ọhụrụ ya nọ,
otu a ka Chineke gị ga-aṅụrị ọṅụ nʼihi gị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.