Aịzaya 62:1
Isaiah 62:1 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi Zayọn agaghị m emechi ọnụ, nʼihi Jerusalem agaghị m anọ jii, ruo mgbe ezi omume ya ga-enwuwa dịka ihe ụtụtụ; mgbe nzọpụta ya kwa ga-enwukwa dịka ọwaọkụ na-enwu enwu.
Isaiah 62:1 in English
Isaiah 62:1 · Berean Standard Bible
For Zion’s sake I will not keep silent, and for Jerusalem’s sake I will not keep still, until her righteousness shines like a bright light, her salvation like a blazing torch.
Context
1Nʼihi Zayọn agaghị m emechi ọnụ,
nʼihi Jerusalem agaghị m anọ jii,
ruo mgbe ezi omume ya ga-enwuwa dịka ihe ụtụtụ;
mgbe nzọpụta ya kwa ga-enwukwa dịka ọwaọkụ na-enwu enwu. 2Mba niile ga-ahụ ezi omume gị.
Ndị eze niile ga-ahụkwa ebube gị.
A ga-akpọkwa gị aha ọhụrụ ahụ
nke ọnụ Onyenwe anyị ga-agụ gị. 3Ị ga-aghọ okpueze nke ịma mma nʼaka Onyenwe anyị,
ihe iyi nʼisi nke ndị ụlọeze nʼaka Chineke gị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.