Aịzaya 62:7
Isaiah 62:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Unu enyekwala ya izuike tutu ruo mgbe ọ ga-eme ka Jerusalem guzosie ike, meekwa ya otuto nke ụwa niile.
Isaiah 62:7 in English
Isaiah 62:7 · Berean Standard Bible
nor give Him any rest until He establishes Jerusalem and makes her the praise of the earth.
Context
5Dịka nwokorobịa si alụrụ nwaagbọghọ na-amaghị nwoke,
otu a ka Onye na-ewu gị* ga-alụ gị,
dịka onye lụrụ nwunye ọhụrụ sị aṅụrị ọṅụ nʼebe nwunye ọhụrụ ya nọ,
otu a ka Chineke gị ga-aṅụrị ọṅụ nʼihi gị. 6Enyela m ndị nche ọnọdụ ọrụ nʼelu mgbidi gị niile, Jerusalem.
Ha agaghị edebe ọnụ ha duu mgbe ọbụla, ma ehihie ma abalị.
Unu ndị na-akpọku Onyenwe anyị,
unu enyela onwe unu izuike. 7Unu enyekwala ya izuike tutu ruo mgbe ọ ga-eme ka Jerusalem guzosie ike,
meekwa ya otuto nke ụwa niile. 8Onyenwe anyị ewerela aka nri ya
werekwa ogwe aka ya ṅụọ iyi sị,
“Ọ dịghịkwa mgbe m ga-enye mkpụrụ ubi gị
ka ọ bụrụ nri nye ndị iro gị ọzọ,
ọ dịghịkwa mgbe ndị ọbịa ga-aṅụkwa mmanya ọhụrụ ahụ
bụ nke ị dọgburu onwe gị nʼọrụ nʼihi ya. 9Ma ndị were ya ka ihe ubi ga-eri ya,
tookwa Onyenwe anyị,
ndị kpokọtara oroma grepu ga-aṅụ ya
nʼime ogige ebe nsọ m.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.