Aịzaya 62:9
Isaiah 62:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma ndị were ya ka ihe ubi ga-eri ya, tookwa Onyenwe anyị, ndị kpokọtara oroma grepu ga-aṅụ ya nʼime ogige ebe nsọ m.”
Isaiah 62:9 in English
Isaiah 62:9 · Berean Standard Bible
For those who harvest grain will eat it and praise the LORD, and those who gather grapes will drink the wine in My holy courts.”
Context
7Unu enyekwala ya izuike tutu ruo mgbe ọ ga-eme ka Jerusalem guzosie ike,
meekwa ya otuto nke ụwa niile. 8Onyenwe anyị ewerela aka nri ya
werekwa ogwe aka ya ṅụọ iyi sị,
“Ọ dịghịkwa mgbe m ga-enye mkpụrụ ubi gị
ka ọ bụrụ nri nye ndị iro gị ọzọ,
ọ dịghịkwa mgbe ndị ọbịa ga-aṅụkwa mmanya ọhụrụ ahụ
bụ nke ị dọgburu onwe gị nʼọrụ nʼihi ya. 9Ma ndị were ya ka ihe ubi ga-eri ya,
tookwa Onyenwe anyị,
ndị kpokọtara oroma grepu ga-aṅụ ya
nʼime ogige ebe nsọ m.” 10Gabiganụ! Gabiganụ sitenụ nʼọnụ ụzọ ama niile.
Dozienụ ụzọ maka ndị m.
Wuzienụ ụzọ niile, wuzienụ okporoụzọ niile.
Bupụsịanụ nkume niile,
weliekwanụ ọkọlọtọ maka mba niile. 11Onyenwe anyị ekwusaala okwu
nye nsọtụ niile nke ụwa sị,
“Gwanụ Ada Zayọn,
‘Lee Onye Nzọpụta gị na-abịa!
Lee, ụgwọ ọrụ ya dị ya nʼaka,
nkwụghachi nke ọ ga-akwụghachi sokwa ya na-abịa.’ ”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.