Aịzaya 60:8
Isaiah 60:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Olee ndị bụ ndị a na-efegharị dịka igwe ojii, ndị na-efegharị dịka ụmụ nduru na-efeba nʼakwụ ha?
Isaiah 60:8 in English
Isaiah 60:8 · Berean Standard Bible
Who are these who fly like clouds, like doves to their shelters?
Context
6Ọtụtụ igwe ịnyịnya kamel nke si Midia
na Efaa ga-ejupụta nʼala gị,*
ma ndị sikwa nʼobodo Sheba
ga-ebutere gị ọlaedo na ụda na-esi isi ụtọ.
Ha ga-ekwusakwa otuto Onyenwe anyị. 7A ga-enye gị igwe ewu na atụrụ niile nke ndị Keda.
Ebule niile nke Nebaiot ga-abụ nke gị.
A ga-anabata ha dịka onyinye nʼelu ebe ịchụ aja m.
Aga m edozi ụlọnsọ m dị ebube, mee ya ka ọ maa mma karịa. 8“Olee ndị bụ ndị a na-efegharị dịka igwe ojii,
ndị na-efegharị dịka ụmụ nduru na-efeba nʼakwụ ha? 9Nʼezie, mụ ka ala ndị ahụ mmiri gbara gburugburu na-echere;
ụgbọ niile nke Tashish ga-ebukwa ụzọ,
na-ebughachi ụmụ gị site nʼebe dị anya,
ha na ọlaọcha na ọlaedo ha niile.
Inye Onyenwe anyị bụ Chineke gị nsọpụrụ,
Onye nsọ nke Izrel,
nʼihi na ọ jirila ịma mma gọzie gị. 10“Ndị mba ọzọ ga-abịa wuziere unu mgbidi unu niile.
Ndị na-achị achị na ndị eze ha niile ga-ejere unu ozi.
Ọ bụ ezie na m tikpọrọ gị nʼiwe m,
ma site nʼamara m, aga m emere gị ebere.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.