Aịzaya 60:10
Isaiah 60:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Ndị mba ọzọ ga-abịa wuziere unu mgbidi unu niile. Ndị na-achị achị na ndị eze ha niile ga-ejere unu ozi. Ọ bụ ezie na m tikpọrọ gị nʼiwe m, ma site nʼamara m, aga m emere gị ebere.
Isaiah 60:10 in English
Isaiah 60:10 · Berean Standard Bible
Foreigners will rebuild your walls, and their kings will serve you. Although I struck you in anger, yet in favor I will show you mercy.
Context
8“Olee ndị bụ ndị a na-efegharị dịka igwe ojii,
ndị na-efegharị dịka ụmụ nduru na-efeba nʼakwụ ha? 9Nʼezie, mụ ka ala ndị ahụ mmiri gbara gburugburu na-echere;
ụgbọ niile nke Tashish ga-ebukwa ụzọ,
na-ebughachi ụmụ gị site nʼebe dị anya,
ha na ọlaọcha na ọlaedo ha niile.
Inye Onyenwe anyị bụ Chineke gị nsọpụrụ,
Onye nsọ nke Izrel,
nʼihi na ọ jirila ịma mma gọzie gị. 10“Ndị mba ọzọ ga-abịa wuziere unu mgbidi unu niile.
Ndị na-achị achị na ndị eze ha niile ga-ejere unu ozi.
Ọ bụ ezie na m tikpọrọ gị nʼiwe m,
ma site nʼamara m, aga m emere gị ebere. 11Ọnụ ụzọ ama gị ga-eghe oghe oge niile
site nʼụtụtụ ruo nʼụtụtụ,
ịnabata akụ niile si na mba dị iche iche.
A ga-edurukwa ndị eze dị iche iche bata nʼime ya nʼọnọdụ ndị a dọtara nʼagha. 12Mba ọbụla jụrụ ijere gị ozi ga-ala nʼiyi;
a ga-ekpochapụ ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.