Aịzaya 60:12
Isaiah 60:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mba ọbụla jụrụ ijere gị ozi ga-ala nʼiyi; a ga-ekpochapụ ha.
Isaiah 60:12 in English
Isaiah 60:12 · Berean Standard Bible
For the nation or kingdom that will not serve you will perish; it will be utterly destroyed.
Context
10“Ndị mba ọzọ ga-abịa wuziere unu mgbidi unu niile.
Ndị na-achị achị na ndị eze ha niile ga-ejere unu ozi.
Ọ bụ ezie na m tikpọrọ gị nʼiwe m,
ma site nʼamara m, aga m emere gị ebere. 11Ọnụ ụzọ ama gị ga-eghe oghe oge niile
site nʼụtụtụ ruo nʼụtụtụ,
ịnabata akụ niile si na mba dị iche iche.
A ga-edurukwa ndị eze dị iche iche bata nʼime ya nʼọnọdụ ndị a dọtara nʼagha. 12Mba ọbụla jụrụ ijere gị ozi ga-ala nʼiyi;
a ga-ekpochapụ ha. 13“Otuto niile na ịma mma niile nke Lebanọn ga-abụ nke gị.
Osisi junipa, na osisi fịa, na osisi junipa, na osisi saipres,
ka a ga-eji chọọ ụlọnsọ m mma.
Aga m emekwa ka ebube jupụta nʼebe ahụ ụkwụ m na-adị mgbe niile. 14Ụmụ ndị na-emegbu gị ga-abịa kpọọ isiala nye gị.
Ndị ahụ niile na-elelị gị ga-abịa daa nʼala nʼihu gị sutu ụkwụ gị ọnụ.
Ha ga-akpọ Jerusalem, Obodo Onyenwe anyị,
Zayọn nke Onye nsọ Izrel.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.