Aịzaya 60:11
Isaiah 60:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọnụ ụzọ ama gị ga-eghe oghe oge niile site nʼụtụtụ ruo nʼụtụtụ, ịnabata akụ niile si na mba dị iche iche. A ga-edurukwa ndị eze dị iche iche bata nʼime ya nʼọnọdụ ndị a dọtara nʼagha.
Isaiah 60:11 in English
Isaiah 60:11 · Berean Standard Bible
Your gates will always stand open; they will never be shut, day or night, so that the wealth of the nations may be brought into you, with their kings being led in procession.
Context
9Nʼezie, mụ ka ala ndị ahụ mmiri gbara gburugburu na-echere;
ụgbọ niile nke Tashish ga-ebukwa ụzọ,
na-ebughachi ụmụ gị site nʼebe dị anya,
ha na ọlaọcha na ọlaedo ha niile.
Inye Onyenwe anyị bụ Chineke gị nsọpụrụ,
Onye nsọ nke Izrel,
nʼihi na ọ jirila ịma mma gọzie gị. 10“Ndị mba ọzọ ga-abịa wuziere unu mgbidi unu niile.
Ndị na-achị achị na ndị eze ha niile ga-ejere unu ozi.
Ọ bụ ezie na m tikpọrọ gị nʼiwe m,
ma site nʼamara m, aga m emere gị ebere. 11Ọnụ ụzọ ama gị ga-eghe oghe oge niile
site nʼụtụtụ ruo nʼụtụtụ,
ịnabata akụ niile si na mba dị iche iche.
A ga-edurukwa ndị eze dị iche iche bata nʼime ya nʼọnọdụ ndị a dọtara nʼagha. 12Mba ọbụla jụrụ ijere gị ozi ga-ala nʼiyi;
a ga-ekpochapụ ha. 13“Otuto niile na ịma mma niile nke Lebanọn ga-abụ nke gị.
Osisi junipa, na osisi fịa, na osisi junipa, na osisi saipres,
ka a ga-eji chọọ ụlọnsọ m mma.
Aga m emekwa ka ebube jupụta nʼebe ahụ ụkwụ m na-adị mgbe niile.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.