Aịzaya 60:6
Isaiah 60:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọtụtụ igwe ịnyịnya kamel nke si Midia na Efaa ga-ejupụta nʼala gị,* ma ndị sikwa nʼobodo Sheba ga-ebutere gị ọlaedo na ụda na-esi isi ụtọ. Ha ga-ekwusakwa otuto Onyenwe anyị.
Isaiah 60:6 in English
Isaiah 60:6 · Berean Standard Bible
Caravans of camels will cover your land, young camels of Midian and Ephah, and all from Sheba will come, bearing gold and frankincense and proclaiming the praises of the LORD.
Context
4“Welienụ anya unu abụọ elu legharịa gburugburu unu,
ha niile na-ezukọta na-abịakwute gị;
ụmụ gị ndị ikom na-esi nʼebe dị anya bịa,
ụmụ gị ndị inyom ka a ga-ekukwa nʼụkwụ. 5Mgbe ahụ, ị ga-elepụ anya ma chakee,
obi gị ga-atọ gị ụtọ, saa mbara nʼihi ọṅụ,
nʼihi na akụ niile nke osimiri ka a ga-ewebatara gị,
akụnụba nke ọtụtụ mba ga-abịara gị. 6Ọtụtụ igwe ịnyịnya kamel nke si Midia
na Efaa ga-ejupụta nʼala gị,*
ma ndị sikwa nʼobodo Sheba
ga-ebutere gị ọlaedo na ụda na-esi isi ụtọ.
Ha ga-ekwusakwa otuto Onyenwe anyị. 7A ga-enye gị igwe ewu na atụrụ niile nke ndị Keda.
Ebule niile nke Nebaiot ga-abụ nke gị.
A ga-anabata ha dịka onyinye nʼelu ebe ịchụ aja m.
Aga m edozi ụlọnsọ m dị ebube, mee ya ka ọ maa mma karịa. 8“Olee ndị bụ ndị a na-efegharị dịka igwe ojii,
ndị na-efegharị dịka ụmụ nduru na-efeba nʼakwụ ha?
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.