Aịzaya 60:5
Isaiah 60:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ahụ, ị ga-elepụ anya ma chakee, obi gị ga-atọ gị ụtọ, saa mbara nʼihi ọṅụ, nʼihi na akụ niile nke osimiri ka a ga-ewebatara gị, akụnụba nke ọtụtụ mba ga-abịara gị.
Isaiah 60:5 in English
Isaiah 60:5 · Berean Standard Bible
Then you will look and be radiant, and your heart will tremble and swell with joy, because the riches of the sea will be brought to you, and the wealth of the nations will come to you.
Context
3Mba niile dị iche iche ga-abịakwute ìhè gị,
ndị eze niile ga-abịaru mmụke nke ọwụwa gị. 4“Welienụ anya unu abụọ elu legharịa gburugburu unu,
ha niile na-ezukọta na-abịakwute gị;
ụmụ gị ndị ikom na-esi nʼebe dị anya bịa,
ụmụ gị ndị inyom ka a ga-ekukwa nʼụkwụ. 5Mgbe ahụ, ị ga-elepụ anya ma chakee,
obi gị ga-atọ gị ụtọ, saa mbara nʼihi ọṅụ,
nʼihi na akụ niile nke osimiri ka a ga-ewebatara gị,
akụnụba nke ọtụtụ mba ga-abịara gị. 6Ọtụtụ igwe ịnyịnya kamel nke si Midia
na Efaa ga-ejupụta nʼala gị,*
ma ndị sikwa nʼobodo Sheba
ga-ebutere gị ọlaedo na ụda na-esi isi ụtọ.
Ha ga-ekwusakwa otuto Onyenwe anyị. 7A ga-enye gị igwe ewu na atụrụ niile nke ndị Keda.
Ebule niile nke Nebaiot ga-abụ nke gị.
A ga-anabata ha dịka onyinye nʼelu ebe ịchụ aja m.
Aga m edozi ụlọnsọ m dị ebube, mee ya ka ọ maa mma karịa.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.