Aịzaya 60:4
Isaiah 60:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Welienụ anya unu abụọ elu legharịa gburugburu unu, ha niile na-ezukọta na-abịakwute gị; ụmụ gị ndị ikom na-esi nʼebe dị anya bịa, ụmụ gị ndị inyom ka a ga-ekukwa nʼụkwụ.
Isaiah 60:4 in English
Isaiah 60:4 · Berean Standard Bible
Lift up your eyes and look around: They all gather and come to you; your sons will come from afar, and your daughters will be carried on the arm.
Context
2Lee, ọchịchịrị na-ekpuchi ụwa niile,
oke ọchịchịrị na-ekpuchi ndị niile bi nʼụwa,
ma Onyenwe anyị ga-awa dịka anyanwụ nʼahụ gị
ebube ya ga-achakwa ka ihe nʼebe i nọ. 3Mba niile dị iche iche ga-abịakwute ìhè gị,
ndị eze niile ga-abịaru mmụke nke ọwụwa gị. 4“Welienụ anya unu abụọ elu legharịa gburugburu unu,
ha niile na-ezukọta na-abịakwute gị;
ụmụ gị ndị ikom na-esi nʼebe dị anya bịa,
ụmụ gị ndị inyom ka a ga-ekukwa nʼụkwụ. 5Mgbe ahụ, ị ga-elepụ anya ma chakee,
obi gị ga-atọ gị ụtọ, saa mbara nʼihi ọṅụ,
nʼihi na akụ niile nke osimiri ka a ga-ewebatara gị,
akụnụba nke ọtụtụ mba ga-abịara gị. 6Ọtụtụ igwe ịnyịnya kamel nke si Midia
na Efaa ga-ejupụta nʼala gị,*
ma ndị sikwa nʼobodo Sheba
ga-ebutere gị ọlaedo na ụda na-esi isi ụtọ.
Ha ga-ekwusakwa otuto Onyenwe anyị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.