Aịzaya 60:3
Isaiah 60:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mba niile dị iche iche ga-abịakwute ìhè gị, ndị eze niile ga-abịaru mmụke nke ọwụwa gị.
Isaiah 60:3 in English
Isaiah 60:3 · Berean Standard Bible
Nations will come to your light, and kings to the brightness of your dawn.
Context
1“Bilie, mụkee, nʼihi na ìhè gị abịala,
ebube Onyenwe anyị awaakwala nʼahụ gị dịka anyanwụ. 2Lee, ọchịchịrị na-ekpuchi ụwa niile,
oke ọchịchịrị na-ekpuchi ndị niile bi nʼụwa,
ma Onyenwe anyị ga-awa dịka anyanwụ nʼahụ gị
ebube ya ga-achakwa ka ihe nʼebe i nọ. 3Mba niile dị iche iche ga-abịakwute ìhè gị,
ndị eze niile ga-abịaru mmụke nke ọwụwa gị. 4“Welienụ anya unu abụọ elu legharịa gburugburu unu,
ha niile na-ezukọta na-abịakwute gị;
ụmụ gị ndị ikom na-esi nʼebe dị anya bịa,
ụmụ gị ndị inyom ka a ga-ekukwa nʼụkwụ. 5Mgbe ahụ, ị ga-elepụ anya ma chakee,
obi gị ga-atọ gị ụtọ, saa mbara nʼihi ọṅụ,
nʼihi na akụ niile nke osimiri ka a ga-ewebatara gị,
akụnụba nke ọtụtụ mba ga-abịara gị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.