Aịzaya 58:8
Isaiah 58:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ bụrụ na i mee ihe ndị a, aga m eme ka ihuọma m chakwasị gị dịka ìhè isi ụtụtụ. A ga-agwọkwa ọrịa gị niile. Mgbe ahụ, ezi omume gị ga-edu gị, ebube Onyenwe anyị ga-echekwa gị nʼazụ.
Isaiah 58:8 in English
Isaiah 58:8 · Berean Standard Bible
Then your light will break forth like the dawn, and your healing will come quickly. Your righteousness will go before you, and the glory of the LORD will be your rear guard.
Context
6“Nke a ọ bụghị ụdị obubu ọnụ m họpụtara:
Ịtọpụ agbụ niile nke ikpe na-ezighị ezi,
na ịtọpụ ụdọ niile nke mmegbu,
na ime ka ndị a na-emegbu nwere onwe ha
na itiji yoku ọbụla? 7Ka i kenye ndị agụụ na-agụ ihe oriri gị,
ka ị kpọbata nʼime ụlọ gị ndị na-enweghị onye inyeaka, ma ndị ogbenye.
Ka i nye ndị na-agba ọtọ uwe,
ka ị hapụ izo onwe gị nʼebe ndị ikwu gị chọrọ inyeaka gị nọ. 8Ọ bụrụ na i mee ihe ndị a, aga m eme ka ihuọma m chakwasị gị dịka ìhè isi ụtụtụ.
A ga-agwọkwa ọrịa gị niile.
Mgbe ahụ, ezi omume gị ga-edu gị,
ebube Onyenwe anyị ga-echekwa gị nʼazụ. 9Mgbe ahụ, ị ga-akpọ, Onyenwe anyị ga-azakwa,
ị ga-eti mkpu akwa maka enyemaka, ọ ga-asị gị, Lekwa m nʼebe a.
“Ọ bụrụ na ị wezuga yoku mmegbu,
ọ bụrụkwa na ịkwụsị ịtụ mkpịsịaka, na ịgbasa okwu ịkpọ asị, 10ọ bụrụ na inye ndị agụụ na-agụ nri,
nyere ndị nọ na mkpa aka,
mgbe ahụ, ìhè gị ga-achawapụta,
ọchịchịrị niile gbara gị gburugburu ga-aghọ ìhè, na-achakwa ka ehihie.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.