Native Bible

Isaiah 58:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

ọ bụrụ na inye ndị agụụ na-agụ nri, nyere ndị nọ na mkpa aka, mgbe ahụ, ìhè gị ga-achawapụta, ọchịchịrị niile gbara gị gburugburu ga-aghọ ìhè, na-achakwa ka ehihie.

Isaiah 58:10 in English

Isaiah 58:10 · Berean Standard Bible

and if you give yourself to the hungry and satisfy the afflicted soul, then your light will go forth in the darkness, and your night will be like noonday.

Context

8Ọ bụrụ na i mee ihe ndị a, aga m eme ka ihuọma m chakwasị gị dịka ìhè isi ụtụtụ. A ga-agwọkwa ọrịa gị niile. Mgbe ahụ, ezi omume gị ga-edu gị, ebube Onyenwe anyị ga-echekwa gị nʼazụ. 9Mgbe ahụ, ị ga-akpọ, Onyenwe anyị ga-azakwa, ị ga-eti mkpu akwa maka enyemaka, ọ ga-asị gị, Lekwa m nʼebe a. “Ọ bụrụ na ị wezuga yoku mmegbu, ọ bụrụkwa na ịkwụsị ịtụ mkpịsịaka, na ịgbasa okwu ịkpọ asị, 10ọ bụrụ na inye ndị agụụ na-agụ nri, nyere ndị nọ na mkpa aka, mgbe ahụ, ìhè gị ga-achawapụta, ọchịchịrị niile gbara gị gburugburu ga-aghọ ìhè, na-achakwa ka ehihie. 11Onyenwe anyị ga na-edu gị mgbe niile. Ọ ga-eme ka afọ jụ gị nʼala kpọrọ nkụ, meekwa ka ị nọrọ nʼahụ isiike. Ị ga-adịkwa ka ubi a gbara ogige nke a na-agba mmiri nke ọma, dịka isi iyi na-adịghị ata ata. 12Ndị gị ga-edozi mkpọmkpọ ebe ochie niile. Ha ga-ebulikwa ntọala nke mgbe ochie. A ga-akpọ unu ndị na-edozi mgbidi dara ada, ndị na-arụzikwa okporoụzọ nke ebe obibi.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.