Aịzaya 58:11
Isaiah 58:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onyenwe anyị ga na-edu gị mgbe niile. Ọ ga-eme ka afọ jụ gị nʼala kpọrọ nkụ, meekwa ka ị nọrọ nʼahụ isiike. Ị ga-adịkwa ka ubi a gbara ogige nke a na-agba mmiri nke ọma, dịka isi iyi na-adịghị ata ata.
Isaiah 58:11 in English
Isaiah 58:11 · Berean Standard Bible
The LORD will always guide you; He will satisfy you in a sun-scorched land and strengthen your frame. You will be like a well-watered garden, like a spring whose waters never fail.
Context
9Mgbe ahụ, ị ga-akpọ, Onyenwe anyị ga-azakwa,
ị ga-eti mkpu akwa maka enyemaka, ọ ga-asị gị, Lekwa m nʼebe a.
“Ọ bụrụ na ị wezuga yoku mmegbu,
ọ bụrụkwa na ịkwụsị ịtụ mkpịsịaka, na ịgbasa okwu ịkpọ asị, 10ọ bụrụ na inye ndị agụụ na-agụ nri,
nyere ndị nọ na mkpa aka,
mgbe ahụ, ìhè gị ga-achawapụta,
ọchịchịrị niile gbara gị gburugburu ga-aghọ ìhè, na-achakwa ka ehihie. 11Onyenwe anyị ga na-edu gị mgbe niile.
Ọ ga-eme ka afọ jụ gị nʼala kpọrọ nkụ,
meekwa ka ị nọrọ nʼahụ isiike.
Ị ga-adịkwa ka ubi a gbara ogige nke a na-agba mmiri nke ọma,
dịka isi iyi na-adịghị ata ata. 12Ndị gị ga-edozi mkpọmkpọ ebe ochie niile.
Ha ga-ebulikwa ntọala nke mgbe ochie.
A ga-akpọ unu ndị na-edozi mgbidi dara ada,
ndị na-arụzikwa okporoụzọ nke ebe obibi. 13“Ọ bụrụ na i debe ụkwụ gị site na-edebeghị ụbọchị izuike nsọ,
sitekwa na-ime ihe ndị na-atọ gị ụtọ nʼụbọchị nsọ m,
ọ bụrụ na ịkpọ ụbọchị izuike m ihe mmasị
na ụbọchị nsọ Onyenwe anyị ihe a na-akwanyere ugwu,
ọ bụrụ na ị sọpụrụ ya site na-emeghị ihe nʼụzọ nke gị,
na-emeghị ọchịchọ nke obi gị, maọbụ ikwugheri ọnụ,
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.