Aịzaya 58:13
Isaiah 58:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Ọ bụrụ na i debe ụkwụ gị site na-edebeghị ụbọchị izuike nsọ, sitekwa na-ime ihe ndị na-atọ gị ụtọ nʼụbọchị nsọ m, ọ bụrụ na ịkpọ ụbọchị izuike m ihe mmasị na ụbọchị nsọ Onyenwe anyị ihe a na-akwanyere ugwu, ọ bụrụ na ị sọpụrụ ya site na-emeghị ihe nʼụzọ nke gị, na-emeghị ọchịchọ nke obi gị, maọbụ ikwugheri ọnụ,
Isaiah 58:13 in English
Isaiah 58:13 · Berean Standard Bible
If you turn your foot from breaking the Sabbath, from doing as you please on My holy day, if you call the Sabbath a delight, and the LORD’s holy day honorable, if you honor it by not going your own way or seeking your own pleasure or speaking idle words,
Context
11Onyenwe anyị ga na-edu gị mgbe niile.
Ọ ga-eme ka afọ jụ gị nʼala kpọrọ nkụ,
meekwa ka ị nọrọ nʼahụ isiike.
Ị ga-adịkwa ka ubi a gbara ogige nke a na-agba mmiri nke ọma,
dịka isi iyi na-adịghị ata ata. 12Ndị gị ga-edozi mkpọmkpọ ebe ochie niile.
Ha ga-ebulikwa ntọala nke mgbe ochie.
A ga-akpọ unu ndị na-edozi mgbidi dara ada,
ndị na-arụzikwa okporoụzọ nke ebe obibi. 13“Ọ bụrụ na i debe ụkwụ gị site na-edebeghị ụbọchị izuike nsọ,
sitekwa na-ime ihe ndị na-atọ gị ụtọ nʼụbọchị nsọ m,
ọ bụrụ na ịkpọ ụbọchị izuike m ihe mmasị
na ụbọchị nsọ Onyenwe anyị ihe a na-akwanyere ugwu,
ọ bụrụ na ị sọpụrụ ya site na-emeghị ihe nʼụzọ nke gị,
na-emeghị ọchịchọ nke obi gị, maọbụ ikwugheri ọnụ, 14mgbe ahụ, ị ga-achọta ọṅụ gị nʼime Onyenwe anyị,
m ga-emekwa ka ịnọkwasị nʼebe dị elu niile nke ala ahụ,
meekwa ka irie oriri na ihe nketa nke nna gị Jekọb.”
Nʼihi na ọnụ Onyenwe anyị ekwuola ya.
58:1 Opi ike bụ ihe e ji akpọkọta ndị agha nʼoge agha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.