Aịzaya 58:9
Isaiah 58:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ahụ, ị ga-akpọ, Onyenwe anyị ga-azakwa, ị ga-eti mkpu akwa maka enyemaka, ọ ga-asị gị, Lekwa m nʼebe a. “Ọ bụrụ na ị wezuga yoku mmegbu, ọ bụrụkwa na ịkwụsị ịtụ mkpịsịaka, na ịgbasa okwu ịkpọ asị,
Isaiah 58:9 in English
Isaiah 58:9 · Berean Standard Bible
Then you will call, and the LORD will answer; you will cry out, and He will say, ‘Here I am.’ If you remove the yoke from your midst, the pointing of the finger and malicious talk,
Context
7Ka i kenye ndị agụụ na-agụ ihe oriri gị,
ka ị kpọbata nʼime ụlọ gị ndị na-enweghị onye inyeaka, ma ndị ogbenye.
Ka i nye ndị na-agba ọtọ uwe,
ka ị hapụ izo onwe gị nʼebe ndị ikwu gị chọrọ inyeaka gị nọ. 8Ọ bụrụ na i mee ihe ndị a, aga m eme ka ihuọma m chakwasị gị dịka ìhè isi ụtụtụ.
A ga-agwọkwa ọrịa gị niile.
Mgbe ahụ, ezi omume gị ga-edu gị,
ebube Onyenwe anyị ga-echekwa gị nʼazụ. 9Mgbe ahụ, ị ga-akpọ, Onyenwe anyị ga-azakwa,
ị ga-eti mkpu akwa maka enyemaka, ọ ga-asị gị, Lekwa m nʼebe a.
“Ọ bụrụ na ị wezuga yoku mmegbu,
ọ bụrụkwa na ịkwụsị ịtụ mkpịsịaka, na ịgbasa okwu ịkpọ asị, 10ọ bụrụ na inye ndị agụụ na-agụ nri,
nyere ndị nọ na mkpa aka,
mgbe ahụ, ìhè gị ga-achawapụta,
ọchịchịrị niile gbara gị gburugburu ga-aghọ ìhè, na-achakwa ka ehihie. 11Onyenwe anyị ga na-edu gị mgbe niile.
Ọ ga-eme ka afọ jụ gị nʼala kpọrọ nkụ,
meekwa ka ị nọrọ nʼahụ isiike.
Ị ga-adịkwa ka ubi a gbara ogige nke a na-agba mmiri nke ọma,
dịka isi iyi na-adịghị ata ata.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.