Aịzaya 58:6
Isaiah 58:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Nke a ọ bụghị ụdị obubu ọnụ m họpụtara: Ịtọpụ agbụ niile nke ikpe na-ezighị ezi, na ịtọpụ ụdọ niile nke mmegbu, na ime ka ndị a na-emegbu nwere onwe ha na itiji yoku ọbụla?
Isaiah 58:6 in English
Isaiah 58:6 · Berean Standard Bible
Isn’t this the fast that I have chosen: to break the chains of wickedness, to untie the cords of the yoke, to set the oppressed free and tear off every yoke?
Context
4Nʼoge ahụ, ọ bụ ise okwu na ịlụ ọgụ,
ya na iti ibe unu ọkpọ nʼihi ajọọ obi ka unu ji emechi ụbọchị ibu ọnụ unu.
Unu apụghị ibu ọnụ otu unu si eme taa
na-ele anya ka anụ olu unu nʼelu. 5Nke a ọ bụ ụdị obubu ọnụ nke m họpụtara,
naanị ụbọchị nke ndị mmadụ ji eweda onwe ha nʼala?
Ọ bụ naanị nke mmadụ ji ehulata isi ya nʼala dịka osisi achara,
nke i dina nʼakwa mkpe na ntụ?
Ọ bụ nke a ka unu na-akpọ obubu ọnụ,
ụbọchị nke Onyenwe anyị nabatara? 6“Nke a ọ bụghị ụdị obubu ọnụ m họpụtara:
Ịtọpụ agbụ niile nke ikpe na-ezighị ezi,
na ịtọpụ ụdọ niile nke mmegbu,
na ime ka ndị a na-emegbu nwere onwe ha
na itiji yoku ọbụla? 7Ka i kenye ndị agụụ na-agụ ihe oriri gị,
ka ị kpọbata nʼime ụlọ gị ndị na-enweghị onye inyeaka, ma ndị ogbenye.
Ka i nye ndị na-agba ọtọ uwe,
ka ị hapụ izo onwe gị nʼebe ndị ikwu gị chọrọ inyeaka gị nọ. 8Ọ bụrụ na i mee ihe ndị a, aga m eme ka ihuọma m chakwasị gị dịka ìhè isi ụtụtụ.
A ga-agwọkwa ọrịa gị niile.
Mgbe ahụ, ezi omume gị ga-edu gị,
ebube Onyenwe anyị ga-echekwa gị nʼazụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.