Native Bible

Isaiah 58:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼoge ahụ, ọ bụ ise okwu na ịlụ ọgụ, ya na iti ibe unu ọkpọ nʼihi ajọọ obi ka unu ji emechi ụbọchị ibu ọnụ unu. Unu apụghị ibu ọnụ otu unu si eme taa na-ele anya ka anụ olu unu nʼelu.

Isaiah 58:4 in English

Isaiah 58:4 · Berean Standard Bible

You fast with contention and strife to strike viciously with your fist. You cannot fast as you do today and have your voice be heard on high.

Context

2Kwa ụbọchị ka ha na-achọ m ha na-eme dịka ọ na-agụ ha agụ ịmara ụzọ m niile, dịka a ga-asị na ha bụ mba na-eme ihe ziri ezi, ndị na-agbakụtaghị iwu Chineke ha azụ. Ha na-ajụ m maka ikpe ziri ezi, na-eme dịka ọ na-agụ ha agụụ ka Chineke bịaruo ha nso. 3Ha na-asị, ‘Nʼihi gịnị ka anyị ji ebu ọnụ, ma ị dịghị ahụta ya? Nʼihi gịnị ka anyị ji weda onwe anyị nʼala, ma ị dịghị ahụta nke a?’ “Ma nʼụbọchị unu na-ebu ọnụ, unu na-eme ihe masịrị unu, unu na-eji anya ike nara ndị na-arụrụ unu ọrụ ihe ha rụpụtara. 4Nʼoge ahụ, ọ bụ ise okwu na ịlụ ọgụ, ya na iti ibe unu ọkpọ nʼihi ajọọ obi ka unu ji emechi ụbọchị ibu ọnụ unu. Unu apụghị ibu ọnụ otu unu si eme taa na-ele anya ka anụ olu unu nʼelu. 5Nke a ọ bụ ụdị obubu ọnụ nke m họpụtara, naanị ụbọchị nke ndị mmadụ ji eweda onwe ha nʼala? Ọ bụ naanị nke mmadụ ji ehulata isi ya nʼala dịka osisi achara, nke i dina nʼakwa mkpe na ntụ? Ọ bụ nke a ka unu na-akpọ obubu ọnụ, ụbọchị nke Onyenwe anyị nabatara? 6“Nke a ọ bụghị ụdị obubu ọnụ m họpụtara: Ịtọpụ agbụ niile nke ikpe na-ezighị ezi, na ịtọpụ ụdọ niile nke mmegbu, na ime ka ndị a na-emegbu nwere onwe ha na itiji yoku ọbụla?

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.