Aịzaya 58:3
Isaiah 58:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha na-asị, ‘Nʼihi gịnị ka anyị ji ebu ọnụ, ma ị dịghị ahụta ya? Nʼihi gịnị ka anyị ji weda onwe anyị nʼala, ma ị dịghị ahụta nke a?’ “Ma nʼụbọchị unu na-ebu ọnụ, unu na-eme ihe masịrị unu, unu na-eji anya ike nara ndị na-arụrụ unu ọrụ ihe ha rụpụtara.
Isaiah 58:3 in English
Isaiah 58:3 · Berean Standard Bible
“Why have we fasted, and You have not seen? Why have we humbled ourselves, and You have not noticed?” “Behold, on the day of your fast, you do as you please, and you oppress all your workers.
Context
1“Welie olu gị tie mkpu, egbochikwala iti mkpu.
Welie olu gị dịka opi ike.*
Gwa ndị m nnupu isi ha,
gwakwa ụlọ Jekọb mmehie ha. 2Kwa ụbọchị ka ha na-achọ m
ha na-eme dịka ọ na-agụ ha agụ ịmara ụzọ m niile,
dịka a ga-asị na ha bụ mba na-eme ihe ziri ezi,
ndị na-agbakụtaghị iwu Chineke ha azụ.
Ha na-ajụ m maka ikpe ziri ezi,
na-eme dịka ọ na-agụ ha agụụ ka Chineke bịaruo ha nso. 3Ha na-asị, ‘Nʼihi gịnị ka anyị ji ebu ọnụ,
ma ị dịghị ahụta ya?
Nʼihi gịnị ka anyị ji weda onwe anyị nʼala,
ma ị dịghị ahụta nke a?’
“Ma nʼụbọchị unu na-ebu ọnụ, unu na-eme ihe masịrị unu,
unu na-eji anya ike nara ndị na-arụrụ unu ọrụ ihe ha rụpụtara. 4Nʼoge ahụ, ọ bụ ise okwu na ịlụ ọgụ,
ya na iti ibe unu ọkpọ nʼihi ajọọ obi ka unu ji emechi ụbọchị ibu ọnụ unu.
Unu apụghị ibu ọnụ otu unu si eme taa
na-ele anya ka anụ olu unu nʼelu. 5Nke a ọ bụ ụdị obubu ọnụ nke m họpụtara,
naanị ụbọchị nke ndị mmadụ ji eweda onwe ha nʼala?
Ọ bụ naanị nke mmadụ ji ehulata isi ya nʼala dịka osisi achara,
nke i dina nʼakwa mkpe na ntụ?
Ọ bụ nke a ka unu na-akpọ obubu ọnụ,
ụbọchị nke Onyenwe anyị nabatara?
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.