Native Bible

Isaiah 58:1 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Welie olu gị tie mkpu, egbochikwala iti mkpu. Welie olu gị dịka opi ike.* Gwa ndị m nnupu isi ha, gwakwa ụlọ Jekọb mmehie ha.

Isaiah 58:1 in English

Isaiah 58:1 · Berean Standard Bible

“Cry aloud, do not hold back! Raise your voice like a ram’s horn. Declare to My people their transgression and to the house of Jacob their sins.

Context

1“Welie olu gị tie mkpu, egbochikwala iti mkpu. Welie olu gị dịka opi ike.* Gwa ndị m nnupu isi ha, gwakwa ụlọ Jekọb mmehie ha. 2Kwa ụbọchị ka ha na-achọ m ha na-eme dịka ọ na-agụ ha agụ ịmara ụzọ m niile, dịka a ga-asị na ha bụ mba na-eme ihe ziri ezi, ndị na-agbakụtaghị iwu Chineke ha azụ. Ha na-ajụ m maka ikpe ziri ezi, na-eme dịka ọ na-agụ ha agụụ ka Chineke bịaruo ha nso. 3Ha na-asị, ‘Nʼihi gịnị ka anyị ji ebu ọnụ, ma ị dịghị ahụta ya? Nʼihi gịnị ka anyị ji weda onwe anyị nʼala, ma ị dịghị ahụta nke a?’ “Ma nʼụbọchị unu na-ebu ọnụ, unu na-eme ihe masịrị unu, unu na-eji anya ike nara ndị na-arụrụ unu ọrụ ihe ha rụpụtara.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.