Aịzaya 53:11
Isaiah 53:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ọ hụsịrị ahụhụ, ọ ga-emesịa hụ ìhè nke ndụ, afọ ga-ejukwa ya, site nʼihe ọmụma ya, ka onye ezi omume ahụ, bụ ohu m ga-eme ka a gụọ ọtụtụ mmadụ dịka ndị ezi omume, ọ ga-ebukwa mmehie ha niile.
Isaiah 53:11 in English
Isaiah 53:11 · Berean Standard Bible
After the anguish of His soul, He will see the light of life * and be satisfied. By His knowledge My righteous Servant will justify many, and He will bear their iniquities.
Context
9E nyefere ya ka e lie ya dịka onye na-emebi iwu,
ọ bụkwa nʼetiti ndị ọgaranya ka e liri ya,
ọ bụ ezie na o nweghị ihe ọjọọ ọbụla o mere,
ọ dịkwaghị okwu aghụghọ si nʼọnụ ya pụta. 10Ma ọ bụ ọchịchọ Onyenwe anyị ịzọpịa ya, na ime ka ọ taa ahụhụ.
Nʼihi na ọnwụ ya bụ aja a chụrụ nʼihi ikpe ọmụma nke mmehie.
Ọ ga-ahụ ọtụtụ ụmụ na ụmụ ụmụ ya; ọ ga-adịkwa ndụ ogologo oge.
Nzube Chineke niile ga-emezukwa site na ya. 11Mgbe ọ hụsịrị ahụhụ,
ọ ga-emesịa hụ ìhè nke ndụ, afọ ga-ejukwa ya,
site nʼihe ọmụma ya, ka onye ezi omume ahụ, bụ ohu m ga-eme ka a gụọ ọtụtụ mmadụ dịka ndị ezi omume,
ọ ga-ebukwa mmehie ha niile. 12Nʼihi ya, aga m enye ya oke nʼetiti ndị bara ụba,*
ọ ga-esokwa ndị bụ dike keta ihe nkwata nʼagha,
nʼihi na ọ wụpụrụ ndụ ya nye ọnwụ,
a gụkọtara ya na ndị na-emebi iwu.
Ma ya onwe ya buuru mmehie ọtụtụ mmadụ,
rịọọkwara ndị na-emebi iwu arịrịọ.
53:8 Ya bụ, kwụpụtara
53:8 Ya bụ, taa ya ahụhụ
53:12 Maọbụ, ndị dị ike
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.