Aịzaya 53:9
Isaiah 53:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
E nyefere ya ka e lie ya dịka onye na-emebi iwu, ọ bụkwa nʼetiti ndị ọgaranya ka e liri ya, ọ bụ ezie na o nweghị ihe ọjọọ ọbụla o mere, ọ dịkwaghị okwu aghụghọ si nʼọnụ ya pụta.
Isaiah 53:9 in English
Isaiah 53:9 · Berean Standard Bible
He was assigned a grave with the wicked, and with a rich man in His death, although He had done no violence, nor was any deceit in His mouth.*
Context
7A kpagburu ya, mesie ya ihe ike,
ma otu mkpụrụ okwu esighị ya nʼọnụ pụta.
E duuru ya pụọ dịka atụrụ a na-aga igbu egbu,
dịka atụrụ a na-akpachapụ ajị ya si anọ nwayọọ nʼihu ndị na-akpacha ya ajị,
otu a ka o si nọdụ na-asagheghị ọnụ ya. 8Site na mmegbu na ikpe ka e ji wepụ ya.
Ma, onye nʼetiti ndị ọgbọ* ya weliri olu kwuo okwu?
Nʼihi na e bipụrụ ya site nʼala ndị dị ndụ;
maka njehie ndị m ka e ji tie ya ihe.* 9E nyefere ya ka e lie ya dịka onye na-emebi iwu,
ọ bụkwa nʼetiti ndị ọgaranya ka e liri ya,
ọ bụ ezie na o nweghị ihe ọjọọ ọbụla o mere,
ọ dịkwaghị okwu aghụghọ si nʼọnụ ya pụta. 10Ma ọ bụ ọchịchọ Onyenwe anyị ịzọpịa ya, na ime ka ọ taa ahụhụ.
Nʼihi na ọnwụ ya bụ aja a chụrụ nʼihi ikpe ọmụma nke mmehie.
Ọ ga-ahụ ọtụtụ ụmụ na ụmụ ụmụ ya; ọ ga-adịkwa ndụ ogologo oge.
Nzube Chineke niile ga-emezukwa site na ya. 11Mgbe ọ hụsịrị ahụhụ,
ọ ga-emesịa hụ ìhè nke ndụ, afọ ga-ejukwa ya,
site nʼihe ọmụma ya, ka onye ezi omume ahụ, bụ ohu m ga-eme ka a gụọ ọtụtụ mmadụ dịka ndị ezi omume,
ọ ga-ebukwa mmehie ha niile.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.