Aịzaya 53:10
Isaiah 53:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma ọ bụ ọchịchọ Onyenwe anyị ịzọpịa ya, na ime ka ọ taa ahụhụ. Nʼihi na ọnwụ ya bụ aja a chụrụ nʼihi ikpe ọmụma nke mmehie. Ọ ga-ahụ ọtụtụ ụmụ na ụmụ ụmụ ya; ọ ga-adịkwa ndụ ogologo oge. Nzube Chineke niile ga-emezukwa site na ya.
Isaiah 53:10 in English
Isaiah 53:10 · Berean Standard Bible
Yet it was the LORD’s will to crush Him and to cause Him to suffer; and when His soul is made a guilt offering,* He will see His offspring, He will prolong His days, and the good pleasure of the LORD will prosper in His hand.
Context
8Site na mmegbu na ikpe ka e ji wepụ ya.
Ma, onye nʼetiti ndị ọgbọ* ya weliri olu kwuo okwu?
Nʼihi na e bipụrụ ya site nʼala ndị dị ndụ;
maka njehie ndị m ka e ji tie ya ihe.* 9E nyefere ya ka e lie ya dịka onye na-emebi iwu,
ọ bụkwa nʼetiti ndị ọgaranya ka e liri ya,
ọ bụ ezie na o nweghị ihe ọjọọ ọbụla o mere,
ọ dịkwaghị okwu aghụghọ si nʼọnụ ya pụta. 10Ma ọ bụ ọchịchọ Onyenwe anyị ịzọpịa ya, na ime ka ọ taa ahụhụ.
Nʼihi na ọnwụ ya bụ aja a chụrụ nʼihi ikpe ọmụma nke mmehie.
Ọ ga-ahụ ọtụtụ ụmụ na ụmụ ụmụ ya; ọ ga-adịkwa ndụ ogologo oge.
Nzube Chineke niile ga-emezukwa site na ya. 11Mgbe ọ hụsịrị ahụhụ,
ọ ga-emesịa hụ ìhè nke ndụ, afọ ga-ejukwa ya,
site nʼihe ọmụma ya, ka onye ezi omume ahụ, bụ ohu m ga-eme ka a gụọ ọtụtụ mmadụ dịka ndị ezi omume,
ọ ga-ebukwa mmehie ha niile. 12Nʼihi ya, aga m enye ya oke nʼetiti ndị bara ụba,*
ọ ga-esokwa ndị bụ dike keta ihe nkwata nʼagha,
nʼihi na ọ wụpụrụ ndụ ya nye ọnwụ,
a gụkọtara ya na ndị na-emebi iwu.
Ma ya onwe ya buuru mmehie ọtụtụ mmadụ,
rịọọkwara ndị na-emebi iwu arịrịọ.
53:8 Ya bụ, kwụpụtara
53:8 Ya bụ, taa ya ahụhụ
53:12 Maọbụ, ndị dị ike
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.