Aịzaya 52:10
Isaiah 52:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onyenwe anyị ga-eme ka mba niile hụrụ ike ya dị nsọ; ebe niile ụwa sọtụrụ ga-ahụkwa nzọpụta Chineke anyị.
Isaiah 52:10 in English
Isaiah 52:10 · Berean Standard Bible
The LORD has bared His holy arm in the sight of all the nations; all the ends of the earth will see the salvation of our God.
Context
8Geenụ ntị! Nụrụnụ olu ndị nche unu,
ndị na-eweli olu ha elu na-eti mkpu ọṅụ.
Nʼihi na mgbe Onyenwe anyị ga-alọghachi Zayọn,
ha ga-ahụ ya anya. 9Tienụ mkpu ọṅụ
unu mkpọmkpọ ebe niile e tikpọrọ etikpọ na Jerusalem,
nʼihi na Onyenwe anyị akasịela ndị ya obi.
Ọ gbapụtala Jerusalem. 10Onyenwe anyị ga-eme
ka mba niile hụrụ ike ya dị nsọ;
ebe niile ụwa sọtụrụ ga-ahụkwa
nzọpụta Chineke anyị. 11Wezuganụ onwe unu, wezuganụ onwe unu, sinụ nʼebe ahụ pụọ.
Unu emetụkwala ihe ọbụla rụrụ arụ aka.
Sitenụ nʼetiti ya pụta, dịrịnụ ọcha,
unu ndị na-ebu ihe dị iche iche nke ụlọ Onyenwe anyị. 12Ma unu agaghị eji ọkụ ọkụ pụọ,
unu agakwaghị agbapụ ọsọ,
nʼihi na Onyenwe anyị ga-ebutere unu ụzọ,
ọ bụkwa ya, Chineke Izrel, ga-echebe unu nʼazụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.