Aịzaya 52:12
Isaiah 52:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma unu agaghị eji ọkụ ọkụ pụọ, unu agakwaghị agbapụ ọsọ, nʼihi na Onyenwe anyị ga-ebutere unu ụzọ, ọ bụkwa ya, Chineke Izrel, ga-echebe unu nʼazụ.
Isaiah 52:12 in English
Isaiah 52:12 · Berean Standard Bible
For you will not leave in a hurry nor flee in haste, for the LORD goes before you, and the God of Israel is your rear guard.
Context
10Onyenwe anyị ga-eme
ka mba niile hụrụ ike ya dị nsọ;
ebe niile ụwa sọtụrụ ga-ahụkwa
nzọpụta Chineke anyị. 11Wezuganụ onwe unu, wezuganụ onwe unu, sinụ nʼebe ahụ pụọ.
Unu emetụkwala ihe ọbụla rụrụ arụ aka.
Sitenụ nʼetiti ya pụta, dịrịnụ ọcha,
unu ndị na-ebu ihe dị iche iche nke ụlọ Onyenwe anyị. 12Ma unu agaghị eji ọkụ ọkụ pụọ,
unu agakwaghị agbapụ ọsọ,
nʼihi na Onyenwe anyị ga-ebutere unu ụzọ,
ọ bụkwa ya, Chineke Izrel, ga-echebe unu nʼazụ. 13Lee, ohu m ga-enwe uche,
a ga-ebulikwa ya elu, ọ ga-abụkwa onye a na-asọpụrụ. 14Dịka ibubo si nwụọ ọtụtụ ndị mmadụ nʼahụ;
otu a ka ihu ya bụ ihe e bibiri ebibi nke ukwuu, nke mere na ọ dịkwaghị ka ihu mmadụ ọzọ,
anụ ahụ ya ka ebibikwara nʼụzọ ọ na-agaghị eyikwa anụ ahụ mmadụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.