Aịzaya 52:14
Isaiah 52:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Dịka ibubo si nwụọ ọtụtụ ndị mmadụ nʼahụ; otu a ka ihu ya bụ ihe e bibiri ebibi nke ukwuu, nke mere na ọ dịkwaghị ka ihu mmadụ ọzọ, anụ ahụ ya ka ebibikwara nʼụzọ ọ na-agaghị eyikwa anụ ahụ mmadụ.
Isaiah 52:14 in English
Isaiah 52:14 · Berean Standard Bible
Just as many were appalled at Him *— His appearance was disfigured beyond that of any man, and His form was marred beyond human likeness—
Context
12Ma unu agaghị eji ọkụ ọkụ pụọ,
unu agakwaghị agbapụ ọsọ,
nʼihi na Onyenwe anyị ga-ebutere unu ụzọ,
ọ bụkwa ya, Chineke Izrel, ga-echebe unu nʼazụ. 13Lee, ohu m ga-enwe uche,
a ga-ebulikwa ya elu, ọ ga-abụkwa onye a na-asọpụrụ. 14Dịka ibubo si nwụọ ọtụtụ ndị mmadụ nʼahụ;
otu a ka ihu ya bụ ihe e bibiri ebibi nke ukwuu, nke mere na ọ dịkwaghị ka ihu mmadụ ọzọ,
anụ ahụ ya ka ebibikwara nʼụzọ ọ na-agaghị eyikwa anụ ahụ mmadụ. 15Otu a ka ọ ga-esi fesaa ọtụtụ mba dị iche iche,*
ndị eze ga-emechikwa ọnụ ha nʼihi ya,
ọ bụ ihe a na-agwaghị ha ka ha ga-ahụ,
ihe ha a ka anụbeghị, ka ha ga-aghọtakwa.
52:7 Maọbụ, na-ezisa
52:15 Maọbụ, otu a ka ọtụtụ mba dị iche iche ga-anọ na mgbagwoju anya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.