Aịzaya 52:11
Isaiah 52:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Wezuganụ onwe unu, wezuganụ onwe unu, sinụ nʼebe ahụ pụọ. Unu emetụkwala ihe ọbụla rụrụ arụ aka. Sitenụ nʼetiti ya pụta, dịrịnụ ọcha, unu ndị na-ebu ihe dị iche iche nke ụlọ Onyenwe anyị.
Isaiah 52:11 in English
Isaiah 52:11 · Berean Standard Bible
Depart, depart, go out from there! Touch no unclean thing;* come out from it, purify yourselves, you who carry the vessels of the LORD.
Context
9Tienụ mkpu ọṅụ
unu mkpọmkpọ ebe niile e tikpọrọ etikpọ na Jerusalem,
nʼihi na Onyenwe anyị akasịela ndị ya obi.
Ọ gbapụtala Jerusalem. 10Onyenwe anyị ga-eme
ka mba niile hụrụ ike ya dị nsọ;
ebe niile ụwa sọtụrụ ga-ahụkwa
nzọpụta Chineke anyị. 11Wezuganụ onwe unu, wezuganụ onwe unu, sinụ nʼebe ahụ pụọ.
Unu emetụkwala ihe ọbụla rụrụ arụ aka.
Sitenụ nʼetiti ya pụta, dịrịnụ ọcha,
unu ndị na-ebu ihe dị iche iche nke ụlọ Onyenwe anyị. 12Ma unu agaghị eji ọkụ ọkụ pụọ,
unu agakwaghị agbapụ ọsọ,
nʼihi na Onyenwe anyị ga-ebutere unu ụzọ,
ọ bụkwa ya, Chineke Izrel, ga-echebe unu nʼazụ. 13Lee, ohu m ga-enwe uche,
a ga-ebulikwa ya elu, ọ ga-abụkwa onye a na-asọpụrụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.