Aịzaya 52:8
Isaiah 52:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Geenụ ntị! Nụrụnụ olu ndị nche unu, ndị na-eweli olu ha elu na-eti mkpu ọṅụ. Nʼihi na mgbe Onyenwe anyị ga-alọghachi Zayọn, ha ga-ahụ ya anya.
Isaiah 52:8 in English
Isaiah 52:8 · Berean Standard Bible
Listen! Your watchmen lift up their voices, together they shout for joy. For every eye will see when the LORD returns to Zion.
Context
6Nʼihi ya, ndị m ga-ama aha m;
nʼihi nke a, ha ga-amarakwa nʼụbọchị ahụ
na ọ bụ Mụ onwe m kwuru na ọ ga-eme.
E, ọ bụ mụ onwe m.” 7Lee ka ha si maa mma nʼelu ugwu
bụ ụkwụ ndị na-eweta* oziọma,
onye na-ekwusa okwu udo,
e, onye na-eweta akụkọ ọma,
onye na-agbasa akụkọ banyere nzọpụta,
onye na-asị Zayọn,
“Lee, Chineke gị bụ eze!” 8Geenụ ntị! Nụrụnụ olu ndị nche unu,
ndị na-eweli olu ha elu na-eti mkpu ọṅụ.
Nʼihi na mgbe Onyenwe anyị ga-alọghachi Zayọn,
ha ga-ahụ ya anya. 9Tienụ mkpu ọṅụ
unu mkpọmkpọ ebe niile e tikpọrọ etikpọ na Jerusalem,
nʼihi na Onyenwe anyị akasịela ndị ya obi.
Ọ gbapụtala Jerusalem. 10Onyenwe anyị ga-eme
ka mba niile hụrụ ike ya dị nsọ;
ebe niile ụwa sọtụrụ ga-ahụkwa
nzọpụta Chineke anyị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.