Native Bible

Isaiah 52:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼihi ya, ndị m ga-ama aha m; nʼihi nke a, ha ga-amarakwa nʼụbọchị ahụ na ọ bụ Mụ onwe m kwuru na ọ ga-eme. E, ọ bụ mụ onwe m.”

Isaiah 52:6 in English

Isaiah 52:6 · Berean Standard Bible

Therefore My people will know My name; therefore they will know on that day that I am He who speaks. Here I am!”

Context

4Nʼihi na otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, “Na mbụ, ọ bụ nʼala Ijipt ka ndị m gara biri, ugbu a, ọ bụ ndị Asịrịa na-akpagbu ha. 5“Ma ugbu a, gịnị ka m nwere nʼebe a?” bụ ihe Onyenwe anyị kwupụtara. “Ebe ọ bụ na e durula ndị m pụọ nʼefu, ndị na-achị ha na-akwakwa ha emo na-achị ha ọchị nlelị,” ka Onyenwe anyị kwupụtara. “Ha na-ekwulukwa aha m ogologo ụbọchị niile. 6Nʼihi ya, ndị m ga-ama aha m; nʼihi nke a, ha ga-amarakwa nʼụbọchị ahụ na ọ bụ Mụ onwe m kwuru na ọ ga-eme. E, ọ bụ mụ onwe m.” 7Lee ka ha si maa mma nʼelu ugwu bụ ụkwụ ndị na-eweta* oziọma, onye na-ekwusa okwu udo, e, onye na-eweta akụkọ ọma, onye na-agbasa akụkọ banyere nzọpụta, onye na-asị Zayọn, “Lee, Chineke gị bụ eze!” 8Geenụ ntị! Nụrụnụ olu ndị nche unu, ndị na-eweli olu ha elu na-eti mkpu ọṅụ. Nʼihi na mgbe Onyenwe anyị ga-alọghachi Zayọn, ha ga-ahụ ya anya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.