Aịzaya 5:27
Isaiah 5:27 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ dịghị onye na-ada mba, ọ dịkwaghị onye nʼasụ ngọngọ nʼime ha, ọ dịghị onye nʼatụ oru ụra maọbụ rahụ ụra, ọ dịghị ihe ike nʼukwu ha nke tọpụrụ atọpụ ọ dịghị ihe ikechi akpụkpọụkwụ nke dọbiri adọbi.*
Isaiah 5:27 in English
Isaiah 5:27 · Berean Standard Bible
None of them grows weary or stumbles; no one slumbers or sleeps. No belt is loose and no sandal strap is broken.
Context
25Nʼihi nke a, iwe Onyenwe anyị dị ọkụ megide ndị ya;
o setịpụrụ aka ya na-etitu ha nʼala.
Ugwu niile ga-ama jijiji,
ozu ndị ahụ dịka ihe na-abaghị uru nʼokporoụzọ niile.
Ma nʼagbanyeghị ihe ndị a niile, iwe ya alaghachibeghị azụ,
aka ya ka setịpụkwara esetipụ. 26Ọ ga-eweli ọkọlọtọ nye mba niile dị nʼebe dị anya,
ọ na-akpọkọta ndị niile nọ na nsọtụ ụwa.
Ma lee, ka ha na-abịa,
ha na-eme ngwa bịa ọsịịsọ.* 27Ọ dịghị onye na-ada mba, ọ dịkwaghị onye nʼasụ ngọngọ nʼime ha,
ọ dịghị onye nʼatụ oru ụra maọbụ rahụ ụra,
ọ dịghị ihe ike nʼukwu ha nke tọpụrụ atọpụ
ọ dịghị ihe ikechi akpụkpọụkwụ nke dọbiri adọbi.* 28Àkụ ha niile dị nkọ,
ekweela ụta ha niile,
ụkwụ ịnyịnya dị ka nkume ọkụ,
ụkwụ ụgbọ agha ha dị ka oke ifufe. 29Ha na-ebigbọ dịka ọdụm,
ha na-ebigbọkwa dịka ụmụ ọdụm;
ha na-asụ mgbe ha wụkwasịrị nʼelu ihe ndọgbu.
Ha na-ejide ndị m, kpụrụ ha laa, ọ dịkwaghị onye nnapụta ha nwere.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.