Native Bible

Isaiah 5:27 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ dịghị onye na-ada mba, ọ dịkwaghị onye nʼasụ ngọngọ nʼime ha, ọ dịghị onye nʼatụ oru ụra maọbụ rahụ ụra, ọ dịghị ihe ike nʼukwu ha nke tọpụrụ atọpụ ọ dịghị ihe ikechi akpụkpọụkwụ nke dọbiri adọbi.*

Isaiah 5:27 in English

Isaiah 5:27 · Berean Standard Bible

None of them grows weary or stumbles; no one slumbers or sleeps. No belt is loose and no sandal strap is broken.

Context

25Nʼihi nke a, iwe Onyenwe anyị dị ọkụ megide ndị ya; o setịpụrụ aka ya na-etitu ha nʼala. Ugwu niile ga-ama jijiji, ozu ndị ahụ dịka ihe na-abaghị uru nʼokporoụzọ niile. Ma nʼagbanyeghị ihe ndị a niile, iwe ya alaghachibeghị azụ, aka ya ka setịpụkwara esetipụ. 26Ọ ga-eweli ọkọlọtọ nye mba niile dị nʼebe dị anya, ọ na-akpọkọta ndị niile nọ na nsọtụ ụwa. Ma lee, ka ha na-abịa, ha na-eme ngwa bịa ọsịịsọ.* 27Ọ dịghị onye na-ada mba, ọ dịkwaghị onye nʼasụ ngọngọ nʼime ha, ọ dịghị onye nʼatụ oru ụra maọbụ rahụ ụra, ọ dịghị ihe ike nʼukwu ha nke tọpụrụ atọpụ ọ dịghị ihe ikechi akpụkpọụkwụ nke dọbiri adọbi.* 28Àkụ ha niile dị nkọ, ekweela ụta ha niile, ụkwụ ịnyịnya dị ka nkume ọkụ, ụkwụ ụgbọ agha ha dị ka oke ifufe. 29Ha na-ebigbọ dịka ọdụm, ha na-ebigbọkwa dịka ụmụ ọdụm; ha na-asụ mgbe ha wụkwasịrị nʼelu ihe ndọgbu. Ha na-ejide ndị m, kpụrụ ha laa, ọ dịkwaghị onye nnapụta ha nwere.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.