Aịzaya 5:28
Isaiah 5:28 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Àkụ ha niile dị nkọ, ekweela ụta ha niile, ụkwụ ịnyịnya dị ka nkume ọkụ, ụkwụ ụgbọ agha ha dị ka oke ifufe.
Isaiah 5:28 in English
Isaiah 5:28 · Berean Standard Bible
Their arrows are sharpened, and all their bows are strung. The hooves of their horses are like flint; their chariot wheels are like a whirlwind.
Context
26Ọ ga-eweli ọkọlọtọ nye mba niile dị nʼebe dị anya,
ọ na-akpọkọta ndị niile nọ na nsọtụ ụwa.
Ma lee, ka ha na-abịa,
ha na-eme ngwa bịa ọsịịsọ.* 27Ọ dịghị onye na-ada mba, ọ dịkwaghị onye nʼasụ ngọngọ nʼime ha,
ọ dịghị onye nʼatụ oru ụra maọbụ rahụ ụra,
ọ dịghị ihe ike nʼukwu ha nke tọpụrụ atọpụ
ọ dịghị ihe ikechi akpụkpọụkwụ nke dọbiri adọbi.* 28Àkụ ha niile dị nkọ,
ekweela ụta ha niile,
ụkwụ ịnyịnya dị ka nkume ọkụ,
ụkwụ ụgbọ agha ha dị ka oke ifufe. 29Ha na-ebigbọ dịka ọdụm,
ha na-ebigbọkwa dịka ụmụ ọdụm;
ha na-asụ mgbe ha wụkwasịrị nʼelu ihe ndọgbu.
Ha na-ejide ndị m, kpụrụ ha laa, ọ dịkwaghị onye nnapụta ha nwere. 30Nʼụbọchị ahụ, ha ga-ebigbọ nʼelu ya
dịka mbigbọ nke oke osimiri.
A sịkwa na mmadụ elegide ala ahụ anya,
ọ ga-ahụ na ọchịchịrị na ihe mgbu,
ọ bụladị anyanwụ ka igwe ojii ga-eme ka ọ gbaa ọchịchịrị.
5:19 Jer 17:15
5:23 Ọpụ 23:8; Ilu 17:15
5:23 Abụ 94:21
5:26 Ndị bịara buo agha a bụ ndị agha mba Asịrịa.
5:27 Jul 2:8
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.