Aịzaya 5:29
Isaiah 5:29 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha na-ebigbọ dịka ọdụm, ha na-ebigbọkwa dịka ụmụ ọdụm; ha na-asụ mgbe ha wụkwasịrị nʼelu ihe ndọgbu. Ha na-ejide ndị m, kpụrụ ha laa, ọ dịkwaghị onye nnapụta ha nwere.
Isaiah 5:29 in English
Isaiah 5:29 · Berean Standard Bible
Their roaring is like that of a lion; they roar like young lions. They growl and seize their prey; they carry it away from deliverance.
Context
27Ọ dịghị onye na-ada mba, ọ dịkwaghị onye nʼasụ ngọngọ nʼime ha,
ọ dịghị onye nʼatụ oru ụra maọbụ rahụ ụra,
ọ dịghị ihe ike nʼukwu ha nke tọpụrụ atọpụ
ọ dịghị ihe ikechi akpụkpọụkwụ nke dọbiri adọbi.* 28Àkụ ha niile dị nkọ,
ekweela ụta ha niile,
ụkwụ ịnyịnya dị ka nkume ọkụ,
ụkwụ ụgbọ agha ha dị ka oke ifufe. 29Ha na-ebigbọ dịka ọdụm,
ha na-ebigbọkwa dịka ụmụ ọdụm;
ha na-asụ mgbe ha wụkwasịrị nʼelu ihe ndọgbu.
Ha na-ejide ndị m, kpụrụ ha laa, ọ dịkwaghị onye nnapụta ha nwere. 30Nʼụbọchị ahụ, ha ga-ebigbọ nʼelu ya
dịka mbigbọ nke oke osimiri.
A sịkwa na mmadụ elegide ala ahụ anya,
ọ ga-ahụ na ọchịchịrị na ihe mgbu,
ọ bụladị anyanwụ ka igwe ojii ga-eme ka ọ gbaa ọchịchịrị.
5:19 Jer 17:15
5:23 Ọpụ 23:8; Ilu 17:15
5:23 Abụ 94:21
5:26 Ndị bịara buo agha a bụ ndị agha mba Asịrịa.
5:27 Jul 2:8
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.