Aịzaya 47:9
Isaiah 47:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma lee anya! Ihe abụọ ndị a na-aga ịbịakwasị gị na mberede. Nʼotu ụbọchị di gị ga-anwụ, ụmụ gị ga-anwụchakwa. Mgbaasị gị niile, na ịdị ike nke ọgwụ okike gị niile, agaghị egbochi ihe ndị a ịbịakwasị gị nʼuju.
Isaiah 47:9 in English
Isaiah 47:9 · Berean Standard Bible
These two things will overtake you in a moment, in a single day: loss of children, and widowhood. They will come upon you in full measure, in spite of your many sorceries and the potency of your spells.
Context
7I kwuru sị,
‘Abụ m eze nwanyị ruo mgbe ebighị ebi!’
Ma i cheghị echiche banyere ihe ndị a,
ị tụgharịghị uche banyere ihe pụrụ ime. 8“Ugbu a gee ntị, gị onye na-eme dịka o si tọọ gị ụtọ.
Gee ntị, gị onye na-anọ nʼudo,
na-asị onwe gị,
‘Ọ bụ naanị m dị, o nweghị onye ọzọ ka m nʼụwa.
O nweghị mgbe m ga-adị ka nwanyị di ya nwụrụ,
maọbụ dịka nwanyị ụmụ ya nwụrụ.’ 9Ma lee anya!
Ihe abụọ ndị a na-aga ịbịakwasị gị
na mberede.
Nʼotu ụbọchị di gị ga-anwụ, ụmụ gị ga-anwụchakwa.
Mgbaasị gị niile, na ịdị ike nke ọgwụ okike gị niile,
agaghị egbochi ihe ndị a ịbịakwasị gị nʼuju. 10Nʼihi na i werela obi gị tụkwasị nʼajọ omume gị
ị na-asị, ‘O nweghị onye na-ahụ m.’
Ma amamihe gị na ihe ọmụma gị na-eduhie gị,
mgbe ị na-asị onwe gị,
‘Ọ bụ naanị mụ onwe m, ọ dịghịkwa onye ọzọ ma ewezuga m.’ 11Ihe ọjọọ ga-abịakwasị gị,
ị gaghị ama otu ị ga-esi gbaa afa iwezuga ya.
Oke mbibi ga-adakwasị gị
nke ị na-agaghị enwe ike iji ego gbara onwe gị;
Ịla nʼiyi nke ị na-atụghị anya ya
ga-abịakwasị gị na mberede.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.