Aịzaya 47:11
Isaiah 47:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ihe ọjọọ ga-abịakwasị gị, ị gaghị ama otu ị ga-esi gbaa afa iwezuga ya. Oke mbibi ga-adakwasị gị nke ị na-agaghị enwe ike iji ego gbara onwe gị; Ịla nʼiyi nke ị na-atụghị anya ya ga-abịakwasị gị na mberede.
Isaiah 47:11 in English
Isaiah 47:11 · Berean Standard Bible
But disaster will come upon you; you will not know how to charm it away. A calamity will befall you that you will be unable to ward off. Devastation will happen to you suddenly and unexpectedly.
Context
9Ma lee anya!
Ihe abụọ ndị a na-aga ịbịakwasị gị
na mberede.
Nʼotu ụbọchị di gị ga-anwụ, ụmụ gị ga-anwụchakwa.
Mgbaasị gị niile, na ịdị ike nke ọgwụ okike gị niile,
agaghị egbochi ihe ndị a ịbịakwasị gị nʼuju. 10Nʼihi na i werela obi gị tụkwasị nʼajọ omume gị
ị na-asị, ‘O nweghị onye na-ahụ m.’
Ma amamihe gị na ihe ọmụma gị na-eduhie gị,
mgbe ị na-asị onwe gị,
‘Ọ bụ naanị mụ onwe m, ọ dịghịkwa onye ọzọ ma ewezuga m.’ 11Ihe ọjọọ ga-abịakwasị gị,
ị gaghị ama otu ị ga-esi gbaa afa iwezuga ya.
Oke mbibi ga-adakwasị gị
nke ị na-agaghị enwe ike iji ego gbara onwe gị;
Ịla nʼiyi nke ị na-atụghị anya ya
ga-abịakwasị gị na mberede. 12“Dokọtazie ọgwụ okike gị niile,
na ihe mgbaasị gị niile.
Ihe ndị ahụ niile i jirila na-eche onwe gị siterị na mgbe ị bụ nwantakịrị.
Ma eleghị anya ha pụrụ inyere gị aka nʼoge dị nʼihu.
Ị pụrụ iji ha menye ndị iro gị ụjọ, maọbụ mee ka ha maa jijiji. 13Ndụmọdụ niile a na-enye gị adịghị enyere gị aka.
Mee ka ndị ahụ ihe banyere ngagharị ọnwa na kpakpando doro anya bịa nso.
Kpọpụta ndị ahụ na-esite nʼihe ha hụrụ na kpakpando akọwa ihe ga-eme site nʼotu ọnwa ruo nʼọnwa nke ọzọ.
Kpọkuo ha ka ha zọpụta gị site na nsogbu nke na-aga ịbịakwasị gị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.