Aịzaya 47:13
Isaiah 47:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndụmọdụ niile a na-enye gị adịghị enyere gị aka. Mee ka ndị ahụ ihe banyere ngagharị ọnwa na kpakpando doro anya bịa nso. Kpọpụta ndị ahụ na-esite nʼihe ha hụrụ na kpakpando akọwa ihe ga-eme site nʼotu ọnwa ruo nʼọnwa nke ọzọ. Kpọkuo ha ka ha zọpụta gị site na nsogbu nke na-aga ịbịakwasị gị.
Isaiah 47:13 in English
Isaiah 47:13 · Berean Standard Bible
You are wearied by your many counselors; let them come forward now and save you— your astrologers who observe the stars, who monthly predict your fate.
Context
11Ihe ọjọọ ga-abịakwasị gị,
ị gaghị ama otu ị ga-esi gbaa afa iwezuga ya.
Oke mbibi ga-adakwasị gị
nke ị na-agaghị enwe ike iji ego gbara onwe gị;
Ịla nʼiyi nke ị na-atụghị anya ya
ga-abịakwasị gị na mberede. 12“Dokọtazie ọgwụ okike gị niile,
na ihe mgbaasị gị niile.
Ihe ndị ahụ niile i jirila na-eche onwe gị siterị na mgbe ị bụ nwantakịrị.
Ma eleghị anya ha pụrụ inyere gị aka nʼoge dị nʼihu.
Ị pụrụ iji ha menye ndị iro gị ụjọ, maọbụ mee ka ha maa jijiji. 13Ndụmọdụ niile a na-enye gị adịghị enyere gị aka.
Mee ka ndị ahụ ihe banyere ngagharị ọnwa na kpakpando doro anya bịa nso.
Kpọpụta ndị ahụ na-esite nʼihe ha hụrụ na kpakpando akọwa ihe ga-eme site nʼotu ọnwa ruo nʼọnwa nke ọzọ.
Kpọkuo ha ka ha zọpụta gị site na nsogbu nke na-aga ịbịakwasị gị. 14Lee, ha bụ ihe efu dịka ahịhịa kpọrọ nkụ.
Ọkụ ga-erechapụkwa ha.
Ha apụghịkwa ịzọpụta onwe ha
site nʼọkụ ahụ na-enwusi ike.
Nʼihi na ọkụ ahụ adịghị ka ọkụ a na-akwanye,
nke a na-anya nʼoge oyi. 15Lee ihe ndị a na-enyocha kpakpando ga-emere gị,
bụ ndị ị na-aṅa ntị na ndụmọdụ ha
site na mgbe ị bụ nwantakịrị.
Ha ga-ahapụ gị gaa nʼụzọ nke aka ha;
ị gaghị enwekwa onye ga-azọpụta gị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.