Aịzaya 47:15
Isaiah 47:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Lee ihe ndị a na-enyocha kpakpando ga-emere gị, bụ ndị ị na-aṅa ntị na ndụmọdụ ha site na mgbe ị bụ nwantakịrị. Ha ga-ahapụ gị gaa nʼụzọ nke aka ha; ị gaghị enwekwa onye ga-azọpụta gị.
Isaiah 47:15 in English
Isaiah 47:15 · Berean Standard Bible
This is what they are to you— those with whom you have labored and traded from youth— each one strays in his own direction; not one of them can save you.
Context
13Ndụmọdụ niile a na-enye gị adịghị enyere gị aka.
Mee ka ndị ahụ ihe banyere ngagharị ọnwa na kpakpando doro anya bịa nso.
Kpọpụta ndị ahụ na-esite nʼihe ha hụrụ na kpakpando akọwa ihe ga-eme site nʼotu ọnwa ruo nʼọnwa nke ọzọ.
Kpọkuo ha ka ha zọpụta gị site na nsogbu nke na-aga ịbịakwasị gị. 14Lee, ha bụ ihe efu dịka ahịhịa kpọrọ nkụ.
Ọkụ ga-erechapụkwa ha.
Ha apụghịkwa ịzọpụta onwe ha
site nʼọkụ ahụ na-enwusi ike.
Nʼihi na ọkụ ahụ adịghị ka ọkụ a na-akwanye,
nke a na-anya nʼoge oyi. 15Lee ihe ndị a na-enyocha kpakpando ga-emere gị,
bụ ndị ị na-aṅa ntị na ndụmọdụ ha
site na mgbe ị bụ nwantakịrị.
Ha ga-ahapụ gị gaa nʼụzọ nke aka ha;
ị gaghị enwekwa onye ga-azọpụta gị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.