Native Bible

Isaiah 47:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼihi na i werela obi gị tụkwasị nʼajọ omume gị ị na-asị, ‘O nweghị onye na-ahụ m.’ Ma amamihe gị na ihe ọmụma gị na-eduhie gị, mgbe ị na-asị onwe gị, ‘Ọ bụ naanị mụ onwe m, ọ dịghịkwa onye ọzọ ma ewezuga m.’

Isaiah 47:10 in English

Isaiah 47:10 · Berean Standard Bible

You were secure in your wickedness; you said, ‘No one sees me.’ Your wisdom and knowledge led you astray; you told yourself, ‘I am, and there is none besides me.’

Context

8“Ugbu a gee ntị, gị onye na-eme dịka o si tọọ gị ụtọ. Gee ntị, gị onye na-anọ nʼudo, na-asị onwe gị, ‘Ọ bụ naanị m dị, o nweghị onye ọzọ ka m nʼụwa. O nweghị mgbe m ga-adị ka nwanyị di ya nwụrụ, maọbụ dịka nwanyị ụmụ ya nwụrụ.’ 9Ma lee anya! Ihe abụọ ndị a na-aga ịbịakwasị gị na mberede. Nʼotu ụbọchị di gị ga-anwụ, ụmụ gị ga-anwụchakwa. Mgbaasị gị niile, na ịdị ike nke ọgwụ okike gị niile, agaghị egbochi ihe ndị a ịbịakwasị gị nʼuju. 10Nʼihi na i werela obi gị tụkwasị nʼajọ omume gị ị na-asị, ‘O nweghị onye na-ahụ m.’ Ma amamihe gị na ihe ọmụma gị na-eduhie gị, mgbe ị na-asị onwe gị, ‘Ọ bụ naanị mụ onwe m, ọ dịghịkwa onye ọzọ ma ewezuga m.’ 11Ihe ọjọọ ga-abịakwasị gị, ị gaghị ama otu ị ga-esi gbaa afa iwezuga ya. Oke mbibi ga-adakwasị gị nke ị na-agaghị enwe ike iji ego gbara onwe gị; Ịla nʼiyi nke ị na-atụghị anya ya ga-abịakwasị gị na mberede. 12“Dokọtazie ọgwụ okike gị niile, na ihe mgbaasị gị niile. Ihe ndị ahụ niile i jirila na-eche onwe gị siterị na mgbe ị bụ nwantakịrị. Ma eleghị anya ha pụrụ inyere gị aka nʼoge dị nʼihu. Ị pụrụ iji ha menye ndị iro gị ụjọ, maọbụ mee ka ha maa jijiji.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.