Aịzaya 47:10
Isaiah 47:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi na i werela obi gị tụkwasị nʼajọ omume gị ị na-asị, ‘O nweghị onye na-ahụ m.’ Ma amamihe gị na ihe ọmụma gị na-eduhie gị, mgbe ị na-asị onwe gị, ‘Ọ bụ naanị mụ onwe m, ọ dịghịkwa onye ọzọ ma ewezuga m.’
Isaiah 47:10 in English
Isaiah 47:10 · Berean Standard Bible
You were secure in your wickedness; you said, ‘No one sees me.’ Your wisdom and knowledge led you astray; you told yourself, ‘I am, and there is none besides me.’
Context
8“Ugbu a gee ntị, gị onye na-eme dịka o si tọọ gị ụtọ.
Gee ntị, gị onye na-anọ nʼudo,
na-asị onwe gị,
‘Ọ bụ naanị m dị, o nweghị onye ọzọ ka m nʼụwa.
O nweghị mgbe m ga-adị ka nwanyị di ya nwụrụ,
maọbụ dịka nwanyị ụmụ ya nwụrụ.’ 9Ma lee anya!
Ihe abụọ ndị a na-aga ịbịakwasị gị
na mberede.
Nʼotu ụbọchị di gị ga-anwụ, ụmụ gị ga-anwụchakwa.
Mgbaasị gị niile, na ịdị ike nke ọgwụ okike gị niile,
agaghị egbochi ihe ndị a ịbịakwasị gị nʼuju. 10Nʼihi na i werela obi gị tụkwasị nʼajọ omume gị
ị na-asị, ‘O nweghị onye na-ahụ m.’
Ma amamihe gị na ihe ọmụma gị na-eduhie gị,
mgbe ị na-asị onwe gị,
‘Ọ bụ naanị mụ onwe m, ọ dịghịkwa onye ọzọ ma ewezuga m.’ 11Ihe ọjọọ ga-abịakwasị gị,
ị gaghị ama otu ị ga-esi gbaa afa iwezuga ya.
Oke mbibi ga-adakwasị gị
nke ị na-agaghị enwe ike iji ego gbara onwe gị;
Ịla nʼiyi nke ị na-atụghị anya ya
ga-abịakwasị gị na mberede. 12“Dokọtazie ọgwụ okike gị niile,
na ihe mgbaasị gị niile.
Ihe ndị ahụ niile i jirila na-eche onwe gị siterị na mgbe ị bụ nwantakịrị.
Ma eleghị anya ha pụrụ inyere gị aka nʼoge dị nʼihu.
Ị pụrụ iji ha menye ndị iro gị ụjọ, maọbụ mee ka ha maa jijiji.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.