Native Bible

Isaiah 47:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

I kwuru sị, ‘Abụ m eze nwanyị ruo mgbe ebighị ebi!’ Ma i cheghị echiche banyere ihe ndị a, ị tụgharịghị uche banyere ihe pụrụ ime.

Isaiah 47:7 in English

Isaiah 47:7 · Berean Standard Bible

You said, ‘I will be queen forever.’ You did not take these things to heart or consider their outcome.

Context

5“Nọdụ duu, baa nʼime ọchịchịrị, gị eze obodo nke ndị Kaldịa; Ọ dịkwaghị mgbe ọzọ a ga-akpọ gị nwanyị nwe alaeze dị iche iche. 6Ewesoro m ndị m iwe, mee ndị ahụ bụ ihe nketa m ka ha ghọọ ihe na-adịghị nsọ. Eweere m ha tinye gị nʼaka, ma i gosighị ha obi ebere. Ọ bụladị ndị bụ agadi nʼetiti ha ka ị bokwasịrị ibu arọ. 7I kwuru sị, ‘Abụ m eze nwanyị ruo mgbe ebighị ebi!’ Ma i cheghị echiche banyere ihe ndị a, ị tụgharịghị uche banyere ihe pụrụ ime. 8“Ugbu a gee ntị, gị onye na-eme dịka o si tọọ gị ụtọ. Gee ntị, gị onye na-anọ nʼudo, na-asị onwe gị, ‘Ọ bụ naanị m dị, o nweghị onye ọzọ ka m nʼụwa. O nweghị mgbe m ga-adị ka nwanyị di ya nwụrụ, maọbụ dịka nwanyị ụmụ ya nwụrụ.’ 9Ma lee anya! Ihe abụọ ndị a na-aga ịbịakwasị gị na mberede. Nʼotu ụbọchị di gị ga-anwụ, ụmụ gị ga-anwụchakwa. Mgbaasị gị niile, na ịdị ike nke ọgwụ okike gị niile, agaghị egbochi ihe ndị a ịbịakwasị gị nʼuju.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.