Aịzaya 47:6
Isaiah 47:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ewesoro m ndị m iwe, mee ndị ahụ bụ ihe nketa m ka ha ghọọ ihe na-adịghị nsọ. Eweere m ha tinye gị nʼaka, ma i gosighị ha obi ebere. Ọ bụladị ndị bụ agadi nʼetiti ha ka ị bokwasịrị ibu arọ.
Isaiah 47:6 in English
Isaiah 47:6 · Berean Standard Bible
I was angry with My people; I profaned My heritage, and I placed them under your control. You showed them no mercy; even on the elderly you laid a most heavy yoke.
Context
4Otu a ka Onye mgbapụta anyị kwuru, Onye ga-azọpụta Izrel. Aha ya bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile,
Onye nsọ Izrel. 5“Nọdụ duu, baa nʼime ọchịchịrị,
gị eze obodo nke ndị Kaldịa;
Ọ dịkwaghị mgbe ọzọ a ga-akpọ gị
nwanyị nwe alaeze dị iche iche. 6Ewesoro m ndị m iwe,
mee ndị ahụ bụ ihe nketa m ka ha ghọọ ihe na-adịghị nsọ.
Eweere m ha tinye gị nʼaka,
ma i gosighị ha obi ebere.
Ọ bụladị ndị bụ agadi nʼetiti ha
ka ị bokwasịrị ibu arọ. 7I kwuru sị,
‘Abụ m eze nwanyị ruo mgbe ebighị ebi!’
Ma i cheghị echiche banyere ihe ndị a,
ị tụgharịghị uche banyere ihe pụrụ ime. 8“Ugbu a gee ntị, gị onye na-eme dịka o si tọọ gị ụtọ.
Gee ntị, gị onye na-anọ nʼudo,
na-asị onwe gị,
‘Ọ bụ naanị m dị, o nweghị onye ọzọ ka m nʼụwa.
O nweghị mgbe m ga-adị ka nwanyị di ya nwụrụ,
maọbụ dịka nwanyị ụmụ ya nwụrụ.’
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.