Aịzaya 47:4
Isaiah 47:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Otu a ka Onye mgbapụta anyị kwuru, Onye ga-azọpụta Izrel. Aha ya bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, Onye nsọ Izrel.
Isaiah 47:4 in English
Isaiah 47:4 · Berean Standard Bible
Our Redeemer—the LORD of Hosts is His name— is the Holy One of Israel.
Context
2Were nkume igwe nri gwee ọka,
wepụ akwa ahụ i ji kpuchie ihu gị.
Chilite uwe mwụda gị, kpughepụ ogwe ụkwụ gị,
mgbe ị na-agabiga iyi dị iche iche. 3A ga-ekpughe ọtọ gị,
tinyekwa gị nʼọnọdụ ihere.
Nʼihi na aga m abọtara ndị m ọbọ,
agaghị m elekwa anya nʼazụ.” 4Otu a ka Onye mgbapụta anyị kwuru, Onye ga-azọpụta Izrel. Aha ya bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile,
Onye nsọ Izrel. 5“Nọdụ duu, baa nʼime ọchịchịrị,
gị eze obodo nke ndị Kaldịa;
Ọ dịkwaghị mgbe ọzọ a ga-akpọ gị
nwanyị nwe alaeze dị iche iche. 6Ewesoro m ndị m iwe,
mee ndị ahụ bụ ihe nketa m ka ha ghọọ ihe na-adịghị nsọ.
Eweere m ha tinye gị nʼaka,
ma i gosighị ha obi ebere.
Ọ bụladị ndị bụ agadi nʼetiti ha
ka ị bokwasịrị ibu arọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.