Native Bible

Isaiah 47:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

A ga-ekpughe ọtọ gị, tinyekwa gị nʼọnọdụ ihere. Nʼihi na aga m abọtara ndị m ọbọ, agaghị m elekwa anya nʼazụ.”

Isaiah 47:3 in English

Isaiah 47:3 · Berean Standard Bible

Your nakedness will be uncovered and your shame will be exposed. I will take vengeance; I will spare no one.”

Context

1“Rịda nʼala, nọdụ na uzuzu, gị nwaagbọghọ na-amaghị nwoke, bụ ada Babilọn, nọdụ nʼala na-ejighị ocheeze, gị eze nwanyị obodo ndị Babilọn. Agaghị akpọkwa gị onye dị nro, maọbụ onye dị pekepeke. 2Were nkume igwe nri gwee ọka, wepụ akwa ahụ i ji kpuchie ihu gị. Chilite uwe mwụda gị, kpughepụ ogwe ụkwụ gị, mgbe ị na-agabiga iyi dị iche iche. 3A ga-ekpughe ọtọ gị, tinyekwa gị nʼọnọdụ ihere. Nʼihi na aga m abọtara ndị m ọbọ, agaghị m elekwa anya nʼazụ.” 4Otu a ka Onye mgbapụta anyị kwuru, Onye ga-azọpụta Izrel. Aha ya bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, Onye nsọ Izrel. 5“Nọdụ duu, baa nʼime ọchịchịrị, gị eze obodo nke ndị Kaldịa; Ọ dịkwaghị mgbe ọzọ a ga-akpọ gị nwanyị nwe alaeze dị iche iche.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.