Aịzaya 47:3
Isaiah 47:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
A ga-ekpughe ọtọ gị, tinyekwa gị nʼọnọdụ ihere. Nʼihi na aga m abọtara ndị m ọbọ, agaghị m elekwa anya nʼazụ.”
Isaiah 47:3 in English
Isaiah 47:3 · Berean Standard Bible
Your nakedness will be uncovered and your shame will be exposed. I will take vengeance; I will spare no one.”
Context
1“Rịda nʼala, nọdụ na uzuzu,
gị nwaagbọghọ na-amaghị nwoke, bụ ada Babilọn,
nọdụ nʼala na-ejighị ocheeze,
gị eze nwanyị obodo ndị Babilọn.
Agaghị akpọkwa gị
onye dị nro, maọbụ onye dị pekepeke. 2Were nkume igwe nri gwee ọka,
wepụ akwa ahụ i ji kpuchie ihu gị.
Chilite uwe mwụda gị, kpughepụ ogwe ụkwụ gị,
mgbe ị na-agabiga iyi dị iche iche. 3A ga-ekpughe ọtọ gị,
tinyekwa gị nʼọnọdụ ihere.
Nʼihi na aga m abọtara ndị m ọbọ,
agaghị m elekwa anya nʼazụ.” 4Otu a ka Onye mgbapụta anyị kwuru, Onye ga-azọpụta Izrel. Aha ya bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile,
Onye nsọ Izrel. 5“Nọdụ duu, baa nʼime ọchịchịrị,
gị eze obodo nke ndị Kaldịa;
Ọ dịkwaghị mgbe ọzọ a ga-akpọ gị
nwanyị nwe alaeze dị iche iche.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.