Aịzaya 44:4
Isaiah 44:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha ga-etopụta etopụta dịka ahịhịa a gbara mmiri, e, dịka osisi pọpla nʼakụkụ iyi jupụtara na mmiri.
Isaiah 44:4 in English
Isaiah 44:4 · Berean Standard Bible
They will sprout among the grass like willows * by flowing streams.
Context
2Nke a bụ ihe Onyenwe anyị na-ekwu,
bụ onye kere unu, onye kpụrụ unu nʼime nʼafọ,
na onye ga-enyere unu aka:
Atụla egwu, gị Jekọb,* ohu m,
atụkwala egwu gị Jeshurun, onye nke m họpụtara. 3Nʼihi na aga m eme ka ala ahụ kpọrọ nkụ nweta mmiri,
mee ka mmiri na-asọgharị nʼala ahụ akpịrị na-akpọ nkụ.
Aga m awụkwasị ụmụ ụmụ unu Mmụọ m,
meekwa ka ngọzị m dịrị ha. 4Ha ga-etopụta etopụta dịka ahịhịa a gbara mmiri,
e, dịka osisi pọpla nʼakụkụ iyi jupụtara na mmiri. 5Ha ga-eji nganga sị, ‘Abụ m nke Onyenwe anyị,’
maọbụ ‘Abụ m nwa nwa Jekọb,’
ebe ndị ọzọ ga-edepụta nʼaka ha, ‘Nke Onyenwe anyị ka m bụ,’
ha ga-agụkwa onwe ha Izrel. 6“Nke a bụ ihe Onyenwe anyị na-ekwu,
onye bụ Eze Izrel na Onye mgbapụta ya, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile:
Mụ onwe bụ Mmalite na Ọgwụgwụ;
ọ dịkwaghị Chineke ọzọ dị ma ewezuga m.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.