Aịzaya 44:5
Isaiah 44:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha ga-eji nganga sị, ‘Abụ m nke Onyenwe anyị,’ maọbụ ‘Abụ m nwa nwa Jekọb,’ ebe ndị ọzọ ga-edepụta nʼaka ha, ‘Nke Onyenwe anyị ka m bụ,’ ha ga-agụkwa onwe ha Izrel.
Isaiah 44:5 in English
Isaiah 44:5 · Berean Standard Bible
One will say, ‘I belong to the LORD,’ another will call himself by the name of Jacob, and still another will write on his hand, ‘The LORD’s,’ and will take the name of Israel.”
Context
3Nʼihi na aga m eme ka ala ahụ kpọrọ nkụ nweta mmiri,
mee ka mmiri na-asọgharị nʼala ahụ akpịrị na-akpọ nkụ.
Aga m awụkwasị ụmụ ụmụ unu Mmụọ m,
meekwa ka ngọzị m dịrị ha. 4Ha ga-etopụta etopụta dịka ahịhịa a gbara mmiri,
e, dịka osisi pọpla nʼakụkụ iyi jupụtara na mmiri. 5Ha ga-eji nganga sị, ‘Abụ m nke Onyenwe anyị,’
maọbụ ‘Abụ m nwa nwa Jekọb,’
ebe ndị ọzọ ga-edepụta nʼaka ha, ‘Nke Onyenwe anyị ka m bụ,’
ha ga-agụkwa onwe ha Izrel. 6“Nke a bụ ihe Onyenwe anyị na-ekwu,
onye bụ Eze Izrel na Onye mgbapụta ya, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile:
Mụ onwe bụ Mmalite na Ọgwụgwụ;
ọ dịkwaghị Chineke ọzọ dị ma ewezuga m. 7Ọ bụkwa onye dị ka m? Ya kwupụta ya.
Ya kwupụta ya, doo ya nʼusoro ka ntị nụrụ!
Ya kwupụta ihe niile mere kemgbe m mere ka ndị m guzosie ike.
Ya kwupụtakwa, ma dokwaa ha nʼusoro,
ihe niile na-aga ime nʼoge dị nʼihu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.