Aịzaya 44:3
Isaiah 44:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi na aga m eme ka ala ahụ kpọrọ nkụ nweta mmiri, mee ka mmiri na-asọgharị nʼala ahụ akpịrị na-akpọ nkụ. Aga m awụkwasị ụmụ ụmụ unu Mmụọ m, meekwa ka ngọzị m dịrị ha.
Isaiah 44:3 in English
Isaiah 44:3 · Berean Standard Bible
For I will pour water on the thirsty land, and currents on the dry ground. I will pour out My Spirit on your descendants, and My blessing on your offspring.
Context
1“Ma ugbu a, gee ntị gị Jekọb, bụ ohu m,
geekwanụ ntị, unu ndị Izrel m họpụtara. 2Nke a bụ ihe Onyenwe anyị na-ekwu,
bụ onye kere unu, onye kpụrụ unu nʼime nʼafọ,
na onye ga-enyere unu aka:
Atụla egwu, gị Jekọb,* ohu m,
atụkwala egwu gị Jeshurun, onye nke m họpụtara. 3Nʼihi na aga m eme ka ala ahụ kpọrọ nkụ nweta mmiri,
mee ka mmiri na-asọgharị nʼala ahụ akpịrị na-akpọ nkụ.
Aga m awụkwasị ụmụ ụmụ unu Mmụọ m,
meekwa ka ngọzị m dịrị ha. 4Ha ga-etopụta etopụta dịka ahịhịa a gbara mmiri,
e, dịka osisi pọpla nʼakụkụ iyi jupụtara na mmiri. 5Ha ga-eji nganga sị, ‘Abụ m nke Onyenwe anyị,’
maọbụ ‘Abụ m nwa nwa Jekọb,’
ebe ndị ọzọ ga-edepụta nʼaka ha, ‘Nke Onyenwe anyị ka m bụ,’
ha ga-agụkwa onwe ha Izrel.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.