Aịzaya 44:2
Isaiah 44:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nke a bụ ihe Onyenwe anyị na-ekwu, bụ onye kere unu, onye kpụrụ unu nʼime nʼafọ, na onye ga-enyere unu aka: Atụla egwu, gị Jekọb,* ohu m, atụkwala egwu gị Jeshurun, onye nke m họpụtara.
Isaiah 44:2 in English
Isaiah 44:2 · Berean Standard Bible
This is the word of the LORD, your Maker, who formed you from the womb and who will help you: “Do not be afraid, O Jacob My servant, Jeshurun,* whom I have chosen.
Context
1“Ma ugbu a, gee ntị gị Jekọb, bụ ohu m,
geekwanụ ntị, unu ndị Izrel m họpụtara. 2Nke a bụ ihe Onyenwe anyị na-ekwu,
bụ onye kere unu, onye kpụrụ unu nʼime nʼafọ,
na onye ga-enyere unu aka:
Atụla egwu, gị Jekọb,* ohu m,
atụkwala egwu gị Jeshurun, onye nke m họpụtara. 3Nʼihi na aga m eme ka ala ahụ kpọrọ nkụ nweta mmiri,
mee ka mmiri na-asọgharị nʼala ahụ akpịrị na-akpọ nkụ.
Aga m awụkwasị ụmụ ụmụ unu Mmụọ m,
meekwa ka ngọzị m dịrị ha. 4Ha ga-etopụta etopụta dịka ahịhịa a gbara mmiri,
e, dịka osisi pọpla nʼakụkụ iyi jupụtara na mmiri.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.