Aịzaya 44:16
Isaiah 44:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọkara nʼime osisi ndị a ka o ji emenwu ọkụ; nʼelu ya kwa ka ọ na-esi nri ya, ọ na-ahụnye anụ, were tajuo afọ ya. Nkụ ahụ ka o ji anya ọkụ na-asị, “Ahaa, ahụ ekpola m ọkụ; ahụla m ọkụ.”
Isaiah 44:16 in English
Isaiah 44:16 · Berean Standard Bible
He burns half of it in the fire, and he roasts meat on that half. He eats the roast and is satisfied. Indeed, he warms himself and says, “Ah! I am warm; I see the fire.”
Context
14Ọ na-egbutu osisi sida dị iche iche,
maọbụ osisi saipres ma ọ bụkwa osisi ook.
Ọ na-ahapụ ya ka o too nʼetiti osisi dị iche iche nke oke ọhịa,
maọbụ kụọ osisi fịa, nke mmiri ozuzo na-eme ka o too nke ọma. 15Ọ bụkwa nkụ ka eji ya e mere;
ụfọdụ ka ọ na-ewere nya ọkụ,
ọ na-eji ya afụnwu ọkụ ghee achịcha.
Sitekwa na ya pịa chi, kpuo ihu nʼala nye ya;
ọ na-emekwa arụsị apịrị apị, kpọọ isiala nye ya. 16Ọkara nʼime osisi ndị a ka o ji emenwu ọkụ;
nʼelu ya kwa ka ọ na-esi nri ya,
ọ na-ahụnye anụ, were tajuo afọ ya.
Nkụ ahụ ka o ji anya ọkụ na-asị,
“Ahaa, ahụ ekpola m ọkụ; ahụla m ọkụ.” 17Ihe fọdụrụ nʼime osisi ahụ ka ọ na-ewere kwaara onwe ya arụsị a pịrị apị;
Ọ na-ada nʼala nʼihu ya, fee ya ofufe.
Ọ na-ekpekwara ya ekpere na-asị,
“Biko, Zọpụta m, nʼihi na chi m ka ị bụ!” 18Ha amaghị ihe ọbụla; ha adịghị aghọtakwa,
nʼihi na-emechiela anya ha ka ha ghara ịhụ ụzọ,
mechiekwa uche ha, ka ha ghara ịghọta.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.