Native Bible

Isaiah 44:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ na-egbutu osisi sida dị iche iche, maọbụ osisi saipres ma ọ bụkwa osisi ook. Ọ na-ahapụ ya ka o too nʼetiti osisi dị iche iche nke oke ọhịa, maọbụ kụọ osisi fịa, nke mmiri ozuzo na-eme ka o too nke ọma.

Isaiah 44:14 in English

Isaiah 44:14 · Berean Standard Bible

He cuts down cedars or retrieves a cypress * or oak. He lets it grow strong among the trees of the forest. He plants a laurel, and the rain makes it grow.

Context

12Ọkpụ ụzụ na-ewere ngwa ọrụ ya na-ahụ ya nʼime icheku ọkụ, ọ na-eji mkpirisi igwe onye ọka tipịa ya nʼụdịdị arụsị, ọ bụ ike nke ogwe aka ya ka o ji akpụ ụzụ. Agụ na-agụ ya, ike na-agwụsịkwa ya; ọ ṅụghị mmiri ọbụla, ọ na-adakwa mba. 13Onye ọka osisi na-esite nʼeriri ọtụtụ tụpụta osisi were pensụlụ kaa ya; ọ na-ewere ngwa ọrụ ya kpụchaa osisi ahụ, were ngwa ọrụ ịka akara, kaa ya akara. Ọ na-arụ ya dịka oyiyi mmadụ, oyiyi mmadụ nʼịma mma ya niile, maka ibi nʼime ụlọ arụsị. 14Ọ na-egbutu osisi sida dị iche iche, maọbụ osisi saipres ma ọ bụkwa osisi ook. Ọ na-ahapụ ya ka o too nʼetiti osisi dị iche iche nke oke ọhịa, maọbụ kụọ osisi fịa, nke mmiri ozuzo na-eme ka o too nke ọma. 15Ọ bụkwa nkụ ka eji ya e mere; ụfọdụ ka ọ na-ewere nya ọkụ, ọ na-eji ya afụnwu ọkụ ghee achịcha. Sitekwa na ya pịa chi, kpuo ihu nʼala nye ya; ọ na-emekwa arụsị apịrị apị, kpọọ isiala nye ya. 16Ọkara nʼime osisi ndị a ka o ji emenwu ọkụ; nʼelu ya kwa ka ọ na-esi nri ya, ọ na-ahụnye anụ, were tajuo afọ ya. Nkụ ahụ ka o ji anya ọkụ na-asị, “Ahaa, ahụ ekpola m ọkụ; ahụla m ọkụ.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.